Miriam na Erọn Megide Mosis
Miriam na Erọn kwuru na ha na-ekwuchitere Nna anyị dịka Mosis na-eme. Ọ zara na ya na Mosis na-ekwurịta okwu ọnụ na ọnụ, ọ bụghị nʼilu. Ọrịa dakwasịrị Miriam. Ozugbo ahụ, Mosis rịọrọ ka a gwọọ ya, ọmụma ụlọikwuu niile wee chere ụbọchị asaa.
12 1Miriam na Erọn kwuru okwu megide Mosis nʼihi nwanyị onye Kush ọ lụrụ—nʼihi na ọ lụọ otu nwanyị onye Kush. 2Ha sịrị, “Ọ bụ naanị site nʼaka Mosis ka Nna anyị kwuru okwu? Ọ bụ na o kwughịkwa okwu site nʼaka anyị?” Nna anyị nụkwara ya.
3Ugbu a, nwoke a bụ Mosis dị umeala nʼobi nke ukwuu, karịa onye ọbụla ọzọ nọ nʼelu ụwa.
4Na mberede, Nna anyị gwara Mosis, Erọn na Miriam sị, “Pụtanụ, unu atọ, bịa nʼụlọ ikwu nzukọ ahụ.” Ha atọ wee pụta.
5Mgbe ahụ, Nna anyị rịdatara nʼogidi igwe ojii, guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ahụ, kpọọ Erọn na Miriam, ha abụọ wee bịaruo nso.
6Ọ sịrị, “Nụrụnụ okwu m: ọ bụrụ na onye amụma nọ nʼetiti unu, mụ onwe m, bụ Nna unu, na-egosi ya onwe m nʼọhụụ, na-agwa ya okwu na nrọ. 7Ọ dịghị otu a nʼebe ohu m Mosis nọ; ọ na-ekwesị ntụkwasị obi nʼụlọ m niile. 8Ya na m na-ekwurịta okwu ọnụ na ọnụ, nke doro anya, ọ bụghịkwa nʼilu, ọ na-ahụkwa ụdịdị Nna anyị. Gịnị mere unu atụghị egwu ikwu okwu megide ohu m Mosis?”
9Iwe Nna anyị wee dị ọkụ megide ha, ọ wee pụọ.
10Mgbe igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ ikwu ahụ kpuo, lee Miriam—jupụtara nʼekpenta, na-acha ọcha ka sno. Erọn tụgharịrị lekwasị Miriam anya, ma lee—o nwere ekpenta. 11Erọn gwara Mosis sị, “Biko, onyenwe m, atụkwasịla anyị mmehie nke enweghị uche anyị na njehie anyị. 12Ekwela ka ọ dịrị ka nwa a mụrụ nwụrụ anwụ, nke anụ ahụ ya rechapụrụ ọkara mgbe ọ na-esi nʼakpanwa nne ya apụta.”
13Mosis wee tikuo Nna anyị mkpu sị, “Biko, Nna m, biko gwọọ ya!”
14Ma Nna anyị gwara Mosis sị, “A sị na nna ya gbụụrụ ya ọnụ mmiri nʼihu, ọ gaghị eme ihere ụbọchị asaa? Mechie ya nʼezi ebe obibi ahụ ụbọchị asaa; mgbe ahụ, kpọghachi ya.”
15A wee mechie Miriam nʼezi ebe obibi ahụ ụbọchị asaa; ndị mmadụ ahụ ebiliteghị ịga njem ruo mgbe a kpọghachiri ya. 16Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị mmadụ ahụ si Hazerọt bilie njem, maa ụlọ ikwu nʼọzara Paran.