Otu Ihe Otiti Ọzọ
Otu ihe otiti fọdụrụ. Nʼetiti abalị, ọkpara ọbụla nʼIjipt ga-anwụ, site nʼocheeze ruo na nkume igwe nri, mkpu ákwá a na-anụtụbeghị ụdị ya ga-adakwa. Ma ọ dịghị nkịta ga-agbọ Izrel ụja — Nna anyị mere ka ọdịiche ahụ pụta ìhè. Mosis ji iwe dị ọkụ si nʼihu Fero pụọ.
11 1Nna anyị gwara Mosis sị, “Ọ bụ naanị otu ihe otiti ọzọ ka m ga-eweta nʼahụ Fero na nʼahụ Ijipt. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ ga-ezipụ unu site nʼebe a; mgbe ọ ga-emekwa ya, ọ ga-achụpụ unu kpamkpam. 2Gwa ndị m okwu: ka nwoke ọbụla rịọ onye agbataobi ya, ka nwanyị ọbụla rịọkwa onye agbataobi ya, ihe ọlaọcha na ọlaedo.”
3Nna anyị mekwara ka ndị Ijipt gosi ndị ya ihuọma. Ọzọkwa, Mosis nʼonwe ya dị ukwuu nke ukwuu nʼala Ijipt, nʼanya ndị na-ejere Fero ozi na nʼanya ndị mmadụ.
4Mosis sịrị, “Ihe a bụ ihe Nna anyị na-ekwu: Nʼihe dịka etiti abalị ka m ga-agafe nʼIjipt,
5“ọ bụkwa ọ bụla e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt ga-anwụ, site nʼọkpara Fero nke na-anọkwasị nʼocheeze ya ruo nʼọkpara nwaagbọghọ ohu nke nọ nʼazụ nkume igwe ihe, na nwa anụmanụ ọbụla e buru ụzọ mụọ. 6Oke mkpu ga-ejupụta nʼala Ijipt niile, nke dị iche nʼebe ọ bụla nke mere na mbụ maọbụ nke ga-eme nʼoge na-abịa. 7Ma ọ bụladị otu nkịta agaghị agbọ ụja nʼebe onye ọbụla nʼime ndị Izrel nọ, ma mmadụ ma anụmanụ, ka unu were mara na Nna anyị na-ekewapụta Ijipt site nʼIzrel. 8Ndị a niile na-ejere gị ozi ga-arịdakwute m, kpọọ isiala nʼihu m, sị, ‘Laa, gị na ndị niile na-eso gị.’ Mgbe nke ahụ gasịrị, aga m apụ.” Mgbe ahụ Mosis sitere nʼebe Fero nọ pụọ nʼoke iwe na-ere ọkụ.
9Nna anyị gwara Mosis sị, “Fero agaghị ege gị ntị, ka ọrụ ebube m wee mụbaa nʼala Ijipt.”
10Mosis na Erọn rụrụ ọrụ ebube ndị a niile nʼihu Fero, ma Nna anyị mere ka obi Fero sie ike, ọ jụkwara izipụ ụmụ Izrel site nʼala ya.