Nna anyị Napụtara Izrel Site nʼAka Sọl
Nahash kwere Jabesh-Gilead nkwa udo n'ọnụahịa anya aka nri nke onye ọ bụla. Sọl, onye nọ na-akọ ubi mgbe ozi ahụ bịara, Mmụọ ahụ jidere, o gbuo ehi ya ịkpọkọta Izrel, ma chụsasịa ndị Amọn tupu ụtụtụ. Ọ jụrụ igbu ndị katọrọ ya: taa Nna anyị wetara nzọpụta.
11 1Mgbe ahụ, Nahash onye Amọn gbagoro maa ụlọikwuu ya ibuso Jebesh-gilead agha. Ndị ikom niile nke Jebesh gwara Nahash sị, “Soro anyị gbaa ndụ, anyị ga-ejekwara gị ozi.”
2Nahash onye Amọn zara sị, “Nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na unu ga-agba: ọ bụ na m ghụpụ anya aka nri nke onye ọbụla, si otu a weta ihere nʼebe Izrel niile nọ.”
3Ndị okenye Jebesh gwara ya sị, “Nye anyị ụbọchị asaa ka anyị zipụ ndị ozi gazuo nʼoke ala Izrel niile. Ọ bụrụ na o nweghị onye ga-azọpụta anyị, anyị ga-enyefe gị onwe anyị.” 4Ndị ozi ahụ rutere Gibea nke Sọl, kọọrọ ndị mmadụ ihe mere, ha niile wee tie mkpu akwa.
5Nʼoge ahụ kpọmkwem, Sọl si nʼubi na-abata, na-eso nʼazụ ehi ya. Ọ jụrụ sị, “Gịnị na-eme ndị a? Gịnị mere ha ji na-ebe akwa?” Ha wee kọọrọ ya akụkọ banyere ndị ikom Jebesh. 6Mgbe Sọl nụrụ okwu ndị a, Mmụọ nke Nna anyị dakwasịrị ya ike; iwe were ya ọkụ nke ukwuu. 7O weere ehi abụọ e kekọrọ ọnụ, bọkasịa ha ntakịrị ntakịrị, were aka ndị ozi zipụ ha gazuo nʼoke ala Izrel niile sị, “Otu a ka a ga-eme ehi nke onye ọbụla na-apụtaghị iso Sọl na Samuel.” Mgbe ahụ, egwu Nna anyị dakwasịrị ndị mmadụ, ha wee pụta dịka otu onye. 8Ọ gụrụ ha ọnụ na Bezek: ụmụ Izrel dị narị puku atọ, ndị ikom Juda dị puku iri atọ. 9Ha gwara ndị ozi ahụ bịara sị, “Gwanụ ndị ikom Jebesh-gilead: Echi, nʼoge anyanwụ ga-ekpo ọkụ, a ga-anapụta unu.” Ndị ozi ahụ gara kọọrọ ndị ikom Jebesh, obi wee dị ha ụtọ. 10Ndị ikom Jebesh sịrị, “Echi, anyị ga-enyefe gị onwe anyị; mee anyị ihe ọbụla masịrị gị.” 11Nʼụbọchị sochirinụ, Sọl kewara ndị mmadụ ụzọ atọ. Nʼoge nche ụtụtụ, ha banyere nʼụlọikwuu ahụ gbuo ndị Amọn ruo mgbe ehihie kporo ọkụ; ndị fọdụrụ gbasasịrị nke mere na mmadụ abụọ ọbụla efọdụkọghị ọnụ.
Mmeghari Alaeze Ọhụrụ nʼIhu Nna anyị
12Ndị mmadụ gwara Samuel sị, “Onye jụrụ sị, ‘Sọl ọ ga-achị anyị?’ Were ndị ikom ahụ nyefee anyị—anyị ga-egbu ha.”
13Ma Sọl sịrị, “A gaghị egbu onye ọbụla taa, nʼihi na taa Nna anyị ewetala nzọpụta nye Izrel.”
14Samuel gwara ndị mmadụ sị, “Bịanụ, ka anyị gaa Gilgal megharịa ọchịchị eze ahụ ọhụrụ nʼebe ahụ.” 15Ndị mmadụ niile gara Gilgal, mee Sọl eze nʼebe ahụ nʼihu Nna anyị. Nʼebe ahụ, ha chụrụ àjà udo nʼihu Nna anyị, Sọl na ndị ikom Izrel niile wee ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu.