Nna Anyị Na-ewezuga Onwe Ya Site Nʼebe Ndị Na-ekwesịghị Ntụkwasị Obi Nọ
A kpọrọ ndị nchụàjà, eze na mba ahụ niile oku. Omume ha anaghị ekwe ha ka ha lọghachi, mgbe ha ji ìgwè atụrụ na ìgwè ehi na-achọ ya, Nna anyị ewepụlarịrị onwe ya. Ọ kpọrọ onwe ya ire ure nye Juda na ọdụm nye Ifrem, mesịa hapụ ha ruo mgbe ahụhụ ga-akpụghachi ha.
5 1Nụrụnụ nke a, unu ndị nchụaja! Ṅaanụ ntị, unu ụlọ Izrel! Geenụ ntị, unu ụlọ eze! Nʼihi na ikpe a bụ maka unu, nʼihi na unu abụrụla ọnyà na Mizpa na ụgbụ a gbasara nʼelu Tebọ.
2“Ndị nnupụisi emibanyela nke ukwuu nʼime igbu mmadụ, ma m ga-adọ ha niile aka na ntị. 3Amaara m Ifrem, Izrel ezokwaghị onwe ya nʼebe m nọ; ugbu a, Ifrem, ị gbaala akwụna, Izrel emerụọkwala.
4“Omume ha agaghị ekwe ka ha lọghachikwute Nna ha, nʼihi na mmụọ nke ịkwa iko nọ nʼime ha, ha amaghịkwa Nna anyị. 5Nganga Izrel na-agba ama megide ya; Izrel na Ifrem na-asọ ngọngọ nʼime mmehie ha; Juda na-esokwa ha sọọ ngọngọ. 6Ha ga-eji igwe atụrụ ha na igwe ehi ha gaa ịchọ Nna anyị, ma ha agaghị achọta ya; o sitela nʼebe ha nọ wezuga onwe ya. 7Ha emesola Nna anyị nʼekwesịghị ntụkwasị obi, nʼihi na ha amụọla ụmụ a na-amụtaghị nʼụzọ ziri ezi. Ugbu a, ọnwa ọhụrụ ga-eripịa ha na ubi ha.
8“Fụọnụ opi na Gibea, fụọnụ opi ike na Rema. Tienụ mkpu agha na Bet-even; lee anya nʼazụ gị, Benjamin! 9Ifrem ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼụbọchị ntaramahụhụ; nʼetiti ebo niile nke Izrel ana m eme ka a mara ihe nke doro anya. 10Ndị isi Juda aghọọla dịka ndị na-enugharị nkume oke ala; aga m awụkwasị ha oke iwe m dịka mmiri. 11A na-emegbu Ifrem, a zọpịala ya nʼikpe, nʼihi na o kpebisiri ike ịgbaso arụsị na-abaghị uru. 12Ya mere, adị m ka nla nʼebe Ifrem nọ, dịkwa ka ire ure nʼebe ụlọ Juda nọ.
13“Ifrem hụrụ ọrịa nke ya, Juda hụrụ ọnya ya meghere emeghe; ya mere Ifrem gbagara Asịrịa, na-arịọ eze ya ukwu enyemaka. Ma eze ahụ apụghị ịgwọ gị ọrịa, maọbụ gwọọ ọnya gị na-ere ure. 14Nʼihi na m ga-adị ka ọdụm nʼebe Ifrem nọ, dịkwa ka nwa ọdụm nʼebe ụlọ Juda nọ. Mụ onwe m ga-adọwasị ha pụọ; aga m ebupu ha, ọ dịghịkwa onye ga-anapụta ha. 15Aga m alaghachi ọzọ nʼebe m nọ, ruo mgbe ha ga-ekweta ikpe ọmụma ha ma chọọ ihu m; nʼime nsogbu ha, ha ga-eji obi ha niile chọọ m.”