Nna Na-eguzogide Obi Ndị Na-efe Arụsị
Ndị okenye bịara ịjụ ya ase mgbe ha bu arụsị nʼobi ha, Nna anyị wee sị na ọ ga-aza ha dịka arụsị ndị ahụ si dị. Ọbụna Noa, Daniel na Job, ọ bụrụ na ha guzo nʼala ikpe mara, ga-azọpụta naanị onwe ha. Ọ dịghị onye a na-anapụta site nʼezi omume onye ọzọ.
14 1Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị okenye Izrel bịakwutere m ma nọdụ ala nʼihu m. 2Okwu Nna anyị ruru m nti, sị:
3Nwa nke mmadụ, ndị ikom ndị a ewerela arụsị ha tinye nʼobi ha, dọbakwa ihe mkpọbi ụkwụ nke ikpe ọmụma ha nʼihu ha. M ga-ekwe ka ha jụta m ase ma ọlị? 4Ya mere, gwa ha okwu sị: Nke a bụ ihe Nna, Onye kachasị ihe niile kwuru: Mgbe onye ọbụla nʼụlọ Izrel were arụsị ya tinye nʼobi ya, dọba ihe mkpọbi ụkwụ nke ikpe ọmụma ya nʼihu ya, ma bịakwute onye amụma, Mụ onwe m, bụ Nna gị, ga-aza ya dịka ọtụtụ arụsị ya si dị, 5ka m wee jide obi ụlọ Izrel nʼaka, bụ ndị niile gbakụtara m azụ site nʼarụsị ha.
6Ya mere, gwa ụlọ Izrel sị: Nna, Onye kachasị ihe niile sịrị: “Chegharịanụ! Sinụ nʼarụsị unu tụgharịa, sitekwanụ nʼihe arụ unu niile tụgharịa ihu unu. 7Mgbe onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa bi nʼIzrel kewapụrụ onwe ya site nʼebe m nọ, were arụsị tinye nʼobi ya, dọba ihe mkpọbi ụkwụ nke ikpe ọmụma ya nʼihu ya, ma bịakwute onye amụma ịjụta m ase, Mụ onwe m, bụ Nna gị, ga-aza ya. 8M ga-echepụ ihu m megide nwoke ahụ, meekwa ya ihe ịrịbaama na ilu; m ga-ebipụ ya site nʼetiti ndị m. Mgbe ahụ, unu ga-amara na mụ onwe m bụ Nna unu.
9Ọ bụrụ na a duhie onye amụma ka o kwuo okwu, ọ bụ Mụ onwe m, bụ Nna gị, duhiere onye amụma ahụ; m ga-esetịpụ aka m megide ya, bibie ya site nʼetiti ndị m bụ Izrel. 10Ha ga-ebu ikpe ọmụma ha—ikpe ọmụma nke onye na-ajụ ajụjụ ga-aha nhata nke onye amụma, 11ka ụlọ Izrel ghara ịkpafukwa site nʼebe m nọ ọzọ, maọbụ jiri nnupụisi ha niile merụọ onwe ha. Ha ga-abụ ụmụ m, mụ onwe m abụrụkwa Nna ha, ka Nna, Onye kachasị ihe niile kwuru.”
Ikpe Anọ Dị Egwu Nke Nna
12Okwu Nna anyị ruru m nti, sị:
13Nwa nke mmadụ, ọ bụrụ na ala mehie megide m site nʼekwesịghị ntụkwasị obi, m ga-esetịpụ aka m megide ya iji bipụ ihe oriri ya, zite ụnwụ nʼelu ya, bipụkwa mmadụ na anụmanụ site na ya, 14ọ bụrụ na ndị ikom atọ ndị a—Noa, Daniel, na Job—nọ nʼime ya, naanị onwe ha ka ha ga-azọpụta site nʼezi omume ha, ka Nna, Onye kachasị ihe niile kwuru.
15Maọbụ ọ bụrụ na m zite anụ ọhịa nʼala ahụ, ha emee ka ọ tọgbọrọ nʼefu na-enweghị mmadụ, ọ dịghịkwa onye na-agafe nʼime ya nʼihi anụ ọhịa ndị ahụ, 16dịka m na-adị ndụ, ka Nna, Onye kachasị ihe niile kwuru, ọbụladị ma ndị ikom atọ ndị a nọ nʼime ya, ha agaghị azọpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom. Ọ bụ naanị onwe ha ka a ga-azọpụta, ma ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu.
17Maọbụ ọ bụrụ na m mee ka mma agha bịakwasị ala ahụ, sị, ‘Ka mma agha gafee nʼala ahụ,’ bipụ mmadụ na anụmanụ site na ya, 18dịka m na-adị ndụ, ka Nna, Onye kachasị ihe niile kwuru, ọbụladị ma ndị ikom atọ ndị a nọ nʼime ya, ha agaghị azọpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom; ọ bụ naanị onwe ha ka a ga-azọpụta.
19Maọbụ ọ bụrụ na m zite ọrịa na-efe efe nʼala ahụ, wụsa iwe m nʼelu ya nʼụzọ ọbara, iji bipụ mmadụ na anụmanụ site na ya. 20Dịka m na-adị ndụ, ka Nna, Onye kachasị ihe niile kwuru, ọbụladị ma Noa, Daniel, na Job nọ nʼime ya, ha agaghị azọpụta nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị; ọ bụ naanị onwe ha, site nʼezi omume ha.
21Nke a bụ ihe Nna, Onye kachasị ihe niile kwuru: Ọ ga-aka njọ nke ukwuu mgbe m zitere ikpe anọ dị egwu m—mma agha, ụnwụ, anụ ọhịa, na ọrịa na-efe efe—megide Jerusalem iji bipụ mmadụ na anụmanụ! 22Ma ndị fọdụrụ ndụ ga-anọgide nʼime ya, bụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom a ga-akpọpụta. Ha ga-abịakwute unu, mgbe unu hụkwara ụzọ ha na omume ha, a ga-akasi unu obi banyere ọdachi ahụ m wetaara Jerusalem—ihe niile m wetaara ya. 23Ha ga-akasi unu obi mgbe unu hụrụ àgwà ha na omume ha, unu ga-amarakwa na ọ dịghị ihe m mere nʼebe ahụ nʼefu, ka Nna, Onye kachasị ihe niile kwuru.