Otuto Bụ Nke Gị
N'ịza ịkwa emo ahụ bụ 'Olee ebe Chineke ha nọ?', abụ ọma ahụ na-atụnyere. Arụsị nwere ọnụ, anya na ntị na-adịghị eme ihe ọ bụla, ndị kpụrụ ha na-aghọkwa ndị na-enweghị ndụ dị ka ihe ha kpụrụ. A gwara otu atọ ka ha tụkwasị Nna anyị obi kama: Izrel, ụlọ Erọn, na ndị niile na-atụ egwu ya.
115 1Ọ bụghị anyị, Nna anyị, ọ bụghị anyị, kama nye aha gị otuto, nʼihi ịhụnanya gị na-adịgide na ikwesi ntụkwasị obi gị.
2Gịnị mere mba niile ga-eji sị, “Olee ebe Chineke ha nọ ugbu a?” 3Nna anyị nọ nʼeluigwe; ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya. 4Arụsị ha bụ ọlaọcha na ọlaedo, ọrụ aka mmadụ. 5Ha nwere ọnụ, ma ha apụghị ikwu okwu; anya, ma ha apụghị ịhụ ụzọ; 6ha nwere ntị, ma ha apụghị ịnụ ihe; imi, ma ha apụghị ịnụ isi; 7ha nwere aka, ma ha apụghị imetụ ihe aka; ụkwụ, ma ha apụghị ije ije; ụda ọbụla adịghịkwa esi nʼakpịrị ha apụta. 8Ndị na-eme ha ga-adị ka ha, otu a kwa onye ọbụla na-atụkwasị ha obi.
9Izrel, tụkwasị Nna anyị obi! Ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha. 10Ụlọ Erọn, tụkwasị Nna anyị obi! Ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha. 11Unu ndị na-atụ egwu Nna anyị, tụkwasịnụ ya obi! Ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
12Nna anyị echetala anyị; ọ ga-agọzi anyị. Ọ ga-agọzi ụlọ Izrel; ọ ga-agọzi ụlọ Erọn; 13ọ ga-agọzi ndị na-atụ egwu Nna anyị, ma ndị dị ala ma ndị ukwu.
14Ka Nna anyị mee ka unu na-amụba karịa, unu na ụmụ unu. 15Ka Nna anyị gọzie unu, Onye kere eluigwe na ụwa.
16Eluigwe bụ eluigwe nke Nna anyị, ma ụwa ka o nyere ụmụ mmadụ. 17Ndị nwụrụ anwụ adịghị eto Nna anyị, ọ dịghịkwa ndị na-arịda nʼebe ịgbachi nkịtị dị. 18Ma anyị ga-agọzi Nna anyị site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Haleluya!