Izrel Si NʼIjipt Pụọ
A kọrọ ọpụpụ ahụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọchị: oké osimiri lere anya otu ugboro gbaa ọsọ, Jọdan laghachiri azụ, ugwu wụliri elu dị ka ebule. Abụ ọma ahụ jụzie ha ajụjụ — gịnị mere unu ji gbaa ọsọ? — ma hapụ ka azịza ya bụrụ ọnụnọ Nna anyị, nke mere ka nkume ghọọ mmiri.
114 1Mgbe Izrel si nʼIjipt pụta, ụlọ Jekọb si nʼetiti ndị na-asụ asụsụ mba ọzọ, 2Juda ghọrọ ebe nsọ Nna anyị, Izrel ghọọ ala ọchịchị ya.
3Oke osimiri lere anya gbapụ ọsọ; osimiri Jọdan laghachiri azụ. 4Ugwu ukwu wuliri elu dịka ebule, ugwu nta dịka ụmụ atụrụ.
5Gịnị mere gị, oke osimiri, i ji gbaa ọsọ? Gịnị mere gị, Jọdan, i ji laghachi azụ? 6Gịnị mere unu, ugwu ukwu, unu ji wulie elu dịka ebule? Gịnị mere unu, ugwu nta, unu ji wulie dịka ụmụ atụrụ?
7Maa jijiji, gị ụwa, nʼihu Nna, Onye na-achị achị, nʼihu Chineke nke Jekọb, 8Onye mere ka nkume ghọọ ọdọ mmiri, ka nkume siri ike ghọọ isi iyi na-asọ asọ.