Nna Anyị Nyere Jọshua Ọrụ
Mmeri na nbi n'Ala Nkwa n'okpuru Jọshụa. Ka ọrụ dị egwu na-amalite, Nna anyị na-eme ka ndị Ya guzosie ike, ọ bụghị n'obi ike nke ha, kama n'ọnụnọ Ya.
1 1Mgbe Mosis bụ ohu Nna anyị nwụsịrị, Nna anyị gwara Jọshua nwa Nun, onye na-enyere Mosis aka, sị:
2“Mosis ohu m anwụọla. Ugbu a, bilie, gafee osimiri Jọdan, gị na ndị a niile, banye nʼala m na-enye ha, bụ ụmụ Izrel. 3Ebe ọbụla unu zọnyere ụkwụ, enyela m ya unu, dịka m kwere Mosis na nkwa. 4Oke ala unu ga-esite nʼọzara na Lebanọn a ruo nʼosimiri ukwu ahụ bụ Yufretis—ala ndị Het niile—ruokwa nʼOke Osimiri ahụ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. 5Ọ dịghị onye ga-eguzogide gị ụbọchị niile nke ndụ gị. Dịka mụ na Mosis nọ, mụ na gị ga-anọ; agaghị m ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ.
6“Dịrị ike, nweekwa obi ike, nʼihi na ị ga-edu ndị a ka ha keta ala ahụ m ṅụụrụ nna nna ha iyi na m ga-enye ha. 7Naanị dịrị ike, nweekwa nnukwu obi ike, lezie anya idebe iwu niile Mosis ohu m nyere gị nʼiwu. Esitela na ya chigharịa gaa aka nri maọbụ aka ekpe, ka ihe wee gaara gị nke ọma ebe ọbụla ị na-aga. 8Ekwela ka Akwụkwọ Iwu a hapụ ọnụ gị; na-atụgharị uche na ya ehihie na abalị, ka i wee lezie anya mee ihe niile e dere nʼime ya. Mgbe ahụ, ụzọ gị ga-aga nke ọma, ị ga-enwekwa ihe ịga nke ọma. 9Ọ bụ na m enyeghị gị iwu? Dịrị ike, nweekwa obi ike. Atụla egwu, adakwala mba, nʼihi na mụ, bụ Nna gị, mụ na gị nọ ebe ọbụla ị na-aga.”
Jọshua Kwadoro Ndị Mmadụ Maka Ịgafe
10Mgbe ahụ, Jọshua nyere ndịisi ndị mmadụ ahụ iwu, sị:
11“Gafee nʼetiti ọmụma ụlọikwuu ahụ ma nye ndị mmadụ iwu sị: ‘Kwadoonụ ihe oriri, nʼihi na mkpụrụ ụbọchị atọ site ugbu a, unu ga-agafe osimiri Jọdan ịbanye nweta ala ahụ Nna unu na-enye unu inwe ya.’”
12Jọshua gwara ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase, sị:
13“Chetanụ ihe Mosis, bụ ohu Nna anyị, nyere unu nʼiwu, sị: ‘Nna unu na-enye unu izuike, ọ ga-enyekwa unu ala a.’ 14Ndị nwunye unu, ụmụ unu, na anụ ụlọ unu ga-anọ nʼala ahụ Mosis nyere unu nʼọwụwa anyanwụ Jọdan; ma unu niile bụ dike nʼagha ga-ejide ngwa agha gafee nʼihu ụmụnne unu inyere ha aka, 15ruo mgbe Nna anyị ga-enye ụmụnne unu izuike, dịka o nyere unu, ha onwe ha ga-enwetakwa ala ahụ ọ na-enye ha. Mgbe ahụ, unu ga-alaghachi nʼala nke unu nweta ya—bụ ala ahụ Mosis, bụ ohu Nna anyị, nyere unu nʼofe Jọdan nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.”
16Ha zara Jọshua sị, “Ihe niile i nyere anyị nʼiwu ka anyị ga-eme, ebe ọbụla ị ga-ezigakwa anyị ka anyị ga-aga. 17Dịka anyị rubeere Mosis isi nʼihe niile, otú ahụ ka anyị ga-erubere gị isi. Naanị ka Nna gị nọnyere gị, dịka o nọnyeere Mosis. 18Onye ọbụla nupụrụ isi megide iwu gị, hapụ irube isi nʼokwu gị, nʼihe ọbụla ị nyere nʼiwu, aghaghị igbu ya. Naanị dịrị ike, nweekwa obi ike.”