Mkpu Akwa Site Na Nsọtụ Ụwa
Nye onyeisi ndị ọ na-edu abụ; jiri ụbọ eriri. Abụ Devid.
Ekpere e zitere site na nsọtụ ụwa, site nʼaka nwoke obi ya na-ada mbà, na-arịọ Nna ya ka o duru ya gaa nʼoké nkume dị elu karịa ya. Ọ chọrọ ibi ebe ahụ kama ileta ya — ụlọikwuu gị ruo mgbe ebighị ebi — na ogologo ndụ nye eze.
61 1Nụrụ mkpu akwa m, Nna m; gee ntị nʼekpere m. 2Site na nsọtụ ụwa ka m na-akpọku gị, mgbe obi na-ada m mba; duru m gaa nʼelu nkume ahụ dị elu karịa m. 3Nʼihi na ị bụụrụ m ebe mgbaba, ụlọ elu siri ike megide onye iro.
4Ọ na-agụ m agụụ ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi, gbabakwa nʼokpuru ndo nku gị. 5Nʼihi na gị, Nna m, anụwo nkwa m niile; i nyewo m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị. 6Tụkwasị afọ na ndụ eze; mee ka afọ ndụ ya gbatịa ruo ọtụtụ ọgbọ. 7Ka ọ nọrọ nʼocheeze nʼihu Nna anyị ruo mgbe ebighị ebi; họpụta ịhụnanya ọgbụgba ndụ gị na ikwesi ntụkwasị obi ka ha chee ya nche. 8Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị mgbe niile, na-emezukwa nkwa m kwa ụbọchị.