Buru Ụzọ Kpee Onwe Gị Ikpe
Wepụ osisi dị n'anya gị tupu i metụ ụrọ dị n'anya onye ọzọ aka. Rịọ, a ga-enye gị. Jiri mkpụrụ ha kpee ndị nkuzi ikpe. Mgbe ahụ, okwu siri ike: ịsị Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, na ọbụna ịrụ ọrụ ebube, adịghị otu ihe ahụ na ime uche Nna.
7 1“Unu ekpela ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe. 2Nʼihi na dịka unu si ekpe ikpe, otú ahụ ka a ga-esi kpee unu ikpe; ihe ọtụtụ unu ji atụ, ọ bụ ya ka a ga-eji tụọrọ unu. 3Gịnị mere i ji ele irighiri ntụ dị nwanne gị nʼanya anya, ma ị naghị ahụ osisi dị gị nʼanya? 4Maọbụ olee otú ị ga-esi sị nwanne gị, ‘Ka m wepụ irighiri ntụ dị gị nʼanya,’ mgbe osisi dịkwa gị nʼanya? 5Onye ihu abụọ, buru ụzọ wepụ osisi dị gị nʼanya; mgbe ahụ ị ga-ahụ ụzọ nke ọma iwepụ irighiri ntụ dị nwanne gị nʼanya.
6“Unu enyela nkịta ihe dị nsọ, unu atụkwasịla ézì ọla unu dị oké ọnụahịa; ha ga-eji ụkwụ zọtọọ ha, chigharịakwa dọwaa unu.
Nna Na-enye Ndị Na-arịọ
7“Rịọọ, a ga-enyekwa unu ya; chọọ, unu ga-achọtakwa; kụọ aka nʼọnụ ụzọ, a ga-emeghekwara unu. 8Nʼihi na onye ọbụla na-arịọ na-anata; onye ọbụla na-achọ na-achọta; a ga-emeghekwara onye ọbụla na-akụ aka nʼọnụ ụzọ. 9Maọbụ onye nʼime unu ka ọ dị, bụ onye nwa ya rịọrọ achịcha, ọ ga-enye ya nkume? 10Maọbụ ọ bụrụ na ọ rịọ azụ, ọ ga-enye ya agwọ? 11Ya mere, ọ bụrụ na unu bụ ndị ọjọọ maara otú e si enye ụmụ unu onyinye dị mma, ọ ga-esi aṅaa bụrụ na Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị enyekwu ndị na-arịọ ya ihe ndị dị mma!
12“Ya mere, nʼihe niile, meso ndị mmadụ mmeso dịka unu chọrọ ka ha mesoo unu; nʼihi na nke a bụ Iwu na okwu Ndị Amụma.
13“Sitenụ nʼọnụ ụzọ ámá dị warara banye; nʼihi na ọnụ ụzọ ámá ahụ sara mbara, ụzọ ahụ dịkwa obosara, nke na-eduba na mbibi, ọtụtụ mmadụ na-esitekwa na ya banye. 14Ma ọnụ ụzọ ámá ahụ dị warara, ụzọ ahụ dịkwa warara, nke na-eduba na ndụ; mmadụ ole na ole na-achọta ya.
A Na-amata Ha site na Mkpụrụ Ha
15“Kpacharanụ anya maka ndị amụma ụgha; ha na-abịakwute unu nʼuwe atụrụ, ma nʼime ha bụ anụ ọhịa nkịta ndị agụụ na-agụ. 16Site na mkpụrụ ha ka unu ga-eji mata ha. A na-esi nʼosisi ogwu aghọta mkpụrụ vaịnị, maọbụ nʼahịhịa ogwu aghọta mkpụrụ fig? 17Nʼotu aka ahụ, osisi ọ bụla dị mma na-amị ezi mkpụrụ, ma osisi ọjọọ na-amị mkpụrụ ọjọọ. 18Osisi dị mma apụghị ịmị mkpụrụ ọjọọ, osisi ọjọọ apụghịkwa ịmị ezi mkpụrụ. 19A na-egbutu osisi ọ bụla na-adịghị amị ezi mkpụrụ, tụba ya nʼọkụ. 20Ya mere, ọ bụ site na mkpụrụ ha ka unu ga-eji mata ha.
Naanị Ndị Na-eme Uche Nna
21“Ọ bụghị onye ọ bụla na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba nʼalaeze Nna anyị, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke bi nʼeluigwe. 22Ọtụtụ mmadụ ga-asị m nʼụbọchị ahụ, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ bụ na anyị ebughị amụma nʼaha gị, chụpụ mmụọ ọjọọ nʼaha gị, meekwa ọtụtụ ọrụ ebube nʼaha gị?’ 23Mgbe ahụ ka m ga-agwa ha nʼihu ọha, ‘Amaghị m unu ma ọlị; sinụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-emebi iwu.’
Wuo Ụlọ nʼElu Oke Nkume
24“Ya mere, onye ọ bụla na-anụ okwu m ndị a ma na-emekwa ha ga-adị ka nwoke maara ihe, onye wuru ụlọ ya nʼelu oke nkume. 25Mmiri zoro, idei mmiri bịa, ifufe fee tie ụlọ ahụ ike, ma ọ daghị, nʼihi na e wuru ya nʼelu oke nkume. 26Ma onye ọ bụla na-anụ okwu m ndị a, ma na-adịghị eme ha, dị ka nwoke nzuzu, onye wuru ụlọ ya nʼelu aja. 27Mmiri zoro, idei mmiri bịa, ifufe fee tie ụlọ ahụ, ọ daa; ọdịda ya dịkwa ukwuu.”
28Mgbe Jisọs kwuchara okwu ndị a, igwe mmadụ ahụ juru anya nʼihi nkuzi ya, 29nʼihi na ọ na-akụziri ha ihe dị ka onye nwere ikike, ọ bụghịkwa dị ka ndị odeakwụkwọ ha.