Jikere Agha maka Uche Nna
Iwe na-ewe ndị enyi ochie mgbe ị kwụsịrị isonyere ha, Pita na-ekwukwa ka ị tụọ anya nke ahụ. Ọ na-agwa ndị na-agụ ya ka ha nwee uche doro anya, na-ele ọbịa na-atamughị ntamu, ma jiri onyinye ọ bụla ha nwere rụọ ọrụ. Ọnwụnwa dị ọkụ abụghị ihe ọhụrụ — ikpe na-amalite nʼezinụlọ nke Nna anyị nʼonwe ya.
4 1Ya mere, ebe ọ bụ na Kraịst tara ahụhụ nʼanụ ahụ, jikerenụ onwe unu kwa nʼotu echiche ahụ: onye ọbụla tara ahụhụ nʼanụ ahụ akwụsịla ime mmehie. 2Ya mere, unu agaghịkwa eji oge fọdụrụ unu nʼanụ ahụ bie ndụ dịka ọchịchọ mmadụ si dị, kama dịka uche Nna anyị si dị. 3Unu ejirila oge zuru ezu mee ihe ndị na-amaghị Nna chọrọ: ibi ndụ nʼomume rụrụ arụ, agụụ anụ ahụ, ịṅụbiga mmanya oke, oriri rụrụ arụ, mmanya ọṅụṅụ, na ofufe arụsị nke na-emebi iwu. 4Ọ na-eju ha anya na unu na-esoghịkwa ha agba ọsọ banye nʼotu idei mmiri nke ndụ rụrụ arụ ahụ, ya mere ha na-akparị unu. 5Ma ha ga-aza onye jikere ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. 6Nke a bụ ihe mere e ji kwusaara ọbụladị ndị nwụrụ anwụ ugbu a oziọma ahụ: ka e kpee ha ikpe nʼanụ ahụ dịka a si ekpe mmadụ niile ikpe, ma ka ha dị ndụ nʼime mmụọ dịka Nna anyị si dị.
7Njedebe ihe niile adịla nso. Ya mere, nweenụ uche doro anya ma jidenụ onwe unu aka ka unu wee nwee ike ikpe ekpere. 8Nke kachasị, nọgidenụ na-ahụ ibe unu nʼanya nke ukwuu, nʼihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie. 9Na-anabatanụ ibe unu dịka ọbịa, nʼenweghị ntamu. 10Onye ọbụla nʼime unu, jiri onyinye ọbụla ọ natara jeere ndị ọzọ ozi, dịka ezigbo ndị nlekọta nke amara dị iche iche nke Nna anyị. 11Onye ọbụla na-ekwu okwu, ya kwuo dịka onye na-ekwupụta nnọọ okwu Nna anyị. Onye ọbụla na-eje ozi, ya jiri ike nke ọ na-enye jee ozi, ka e wee nye ya otuto nʼihe niile site na Jisọs Kraịst. Nke ya bụ otuto na ike ruo mgbe ebighị ebi. Amen.
Ịta Ahụhụ nʼAha Nna
12Ndị m hụrụ nʼanya, ka ọ ghara iju unu anya banyere ọnwụnwa ọkụ ahụ nke na-anwale unu, dịka a ga-asị na ihe dị iche na-eme unu. 13Kama, ṅụrịanụ ọṅụ ka unu si eketa òkè nʼahụhụ Kraịst, ka unu wee ṅụrịakwa ọṅụ nke ukwuu mgbe e kpughere otuto ya. 14Ọ bụrụ na a kparịa unu nʼihi aha Kraịst, ngọzi na-adịrị unu, nʼihi na Mmụọ nke otuto na nke Nna anyị na-ezu ike nʼelu unu. 15Ka onye ọbụla nʼime unu ghara ịta ahụhụ dịka ogbu mmadụ, onye ohi, onye omekome, maọbụ onye na-etinye ọnụ nʼihe gbasara ndị ọzọ. 16Ma ọ bụrụ na ị na-ata ahụhụ dịka onye Kraịst, ka ihere ghara ime gị, kama too Nna anyị na ị na-ebu aha ahụ. 17Nʼihi na oge eruola ka ikpe malite nʼezinụlọ Nna anyị; ọ bụrụ na o si nʼebe anyị nọ malite, gịnị ga-abụ ọnọdụ ndị na-anaghị erube isi nʼoziọma Nna anyị? 18Ọzọkwa, “Ọ bụrụ na a na-esi ike ịzọpụta onye ezi omume, gịnị ga-adakwasị onye na-asọpụrụghị Chineke na onye mmehie?” 19Ya mere, ndị na-ata ahụhụ dịka uche Nna anyị si dị kwesịrị iwere mkpụrụobi ha nyefee Onye kere ha nke kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ezi ihe.