Ịgbachi Nkịtị Jupụtara nʼOtuto
Nye onyeisi ndị ọbụ abụ. Abụ Ọma nke Devid. Abụ.
Otuto na-amalite nʼịgbachi nkịtị, ma jedebe nʼubi na-eme mkpọtụ. Nna anyị na-ekpuchi mmehie ma na-anụ ekpere site na nsọtụ ụwa, mgbe ahụ e kpube afọ nʼonwe ya okpueze: mmiri ezoo nʼọwa ubi, ọṅụ ekechie ugwu niile, ala ahịhịa na ndagwurugwu na-eti mkpu ọṅụ nʼotu.
65 1Otuto na-echere gị nʼịgbachi nkịtị, Nna anyị, na Zayọn; a ga-emezukwara gị nkwa anyị.
2Ị na-anụ ekpere, mmadụ niile ga-abịakwute gị. 3Mgbe mmehie karịrị m ike, i kpuchiri nnupụisi anyị. a a v3 Mgbaghara nke Nna anyị na-enye nʼebe a na-ezu oke na Jisọs, onye buuru njehie anyị nʼelu onwe ya ka e wee kpọlata anyị nʼụlọ. 4Ngọzị na-adịrị onye ị họọrọ ma kpọbata ka o biri nʼogige gị. Ihe ọma nke ụlọ gị ga-ejupụta anyị, bụ ịdị nsọ nke ụlọnsọ gị.
5Ị na-aza anyị site nʼọrụ dị egwu nke ezi omume, Nna anyị onye na-azọpụta anyị, olileanya nke nsọtụ niile nke ụwa na nke oke osimiri ndị dịkarịsịrị anya, 6onye jiri ike ya hiwe ugwu ukwu ndị ahụ, bụ onye yi ike dịka uwe; 7onye na-eme ka mkpọtọ nke oke osimiri dajụọ, bụ mkpọtọ nke ebili mmiri ha, na ọgba aghara nke mba niile. 8Ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa na-atụ egwu nʼihi ọrụ ebube gị; ị na-eme ka chi ọbụbọ na chi ọchịchịrị tie mkpu ọṅụ.
9Ị na-elekọta ala ma na-agba ya mmiri; ị na-eme ka ọ baa ụba nke ukwuu. Osimiri nke Nna anyị jupụtara na mmiri; ị na-enye ndị mmadụ ọka ha, nʼihi na otu a ka i siri kwadebe ala. 10Ị na-awụsa mmiri nʼolulu ya niile ma kwatuo okpokoro ya; ị na-eji mmiri ozuzo eme ka ọ dị nro ma gọzie uto ya. 11Ị na-eji ihe ọma gị kpube afọ okpueze, ụzọ gị niile na-asọpụtakwa ụba. 12Ebe ịta nri nke ọzara na-asọpụta ụba, ọṅụ ekpuchikwala ugwu nta niile. 13Igwe anụ ụlọ ekpuchiela mbara ala ahịhịa dịka uwe, ọka ekpuchikwala ndagwurugwu niile; ha na-eti mkpu ọṅụ ma na-abụkọ abụ ọnụ.