Ụzọ Abụọ, Njedebe Abụọ
Akwụkwọ ekpere na akwụkwọ abụ nke ndị Nna anyị—otu narị abụ ọma na iri ise nke otuto, akwa arịrị, ekele, na ntụkwasị obi, ndị na-agafe oge ọ bụla nke obi mmadụ, e wetara n'eziokwu n'ihu Nna anyị.
1 1Ngọzi na-adịrị onye nke na-adịghị eje ije nʼime ndụmọdụ ndị ajọ omume, maọbụ guzoro nʼetiti ndị mmehie, maọbụ nọdụ ala nʼoche ndị na-akwa emo, 2kama ọ bụ nʼiwu Nna anyị ka obi ụtọ ya dị, nʼiwu ya kwa ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị. 3Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya nʼoge ya, akwụkwọ ya adịghịkwa akpọnwụ— ihe ọbụla ọ na-eme na-agakwa nke ọma.
4Ndị ajọ omume adịghị otú a! Ha dị ka igbugbo ọka nke ikuku na-efu efu. 5Nʼihi ya, ndị ajọ omume agaghị eguzosi ike nʼoge ikpe, ndị mmehie agaghịkwa eguzo nʼọgbakọ ndị ezi omume. 6Nʼihi na Nna anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche, ma ụzọ ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.