Ụmụ Ndịnyom Zelofehad
Ụmụnne nwanyị ise jụrụ ihe mere aha nna ha ga-eji kwụsị nʼihi na o nweghị nwa nwoke. Nna anyị sịrị na ha kwuru eziokwu, o wee gbanwee iwu ihe nketa. A gwara Mosis na ọ ga-anwụ nʼezi ala ahụ, ọ rịọkwa ka e nye ndị ahụ onye ọzụzụ atụrụ. E chiri Joshua nʼihu ha niile.
27 1Ụmụ ndịnyom Zelofehad nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, ndị si nʼikwu Manase nwa Josef, bịara nso. Aha ụmụ ya ndịnyom bụ: Mahla, Noa, Hogla, Milka, Tiza. 2Ha guzoro nʼihu Mosis, nʼihu Elieza onye nchụàjà, nʼihu ndị ndu na nzukọ ahụ niile, nʼọnụ ụzọ ụlọikwuu nzukọ, sị: 3“Nna anyị nwụrụ nʼọzara. Ọ bụghị otu nʼime ndị jikọrọ onwe ha megide Nna anyị na ndị otu Kora; ọ nwụrụ nʼihi mmehie nke aka ya, ọ mụtaghịkwa ụmụ nwoke. 4Gịnị mere aha nna anyị ga-eji kwụsị nʼikwu ya nʼihi na o nweghị nwa nwoke? Nye anyị ihe nketa nʼetiti ụmụnne nna anyị.”
5Ya mere, Mosis wegaara Nna anyị okwu ha. 6Nna anyị gwara Mosis, sị:
7“Ihe ụmụ ndịnyom Zelofehad kwuru ziri ezi. Nye ha oke ihe nketa nʼetiti ụmụnne nna ha, meekwa ka ihe nketa nna ha bụrụ nke ha. 8Gwa ụmụ Izrel sị: Ọ bụrụ na nwoke anwụọ na-amụtaghị nwa nwoke, meenụ ka ihe nketa ya bụrụ nke nwa ya nwanyị. 9Ọ bụrụ na o nweghị nwa nwanyị, unu ga-enye ụmụnne ya ihe nketa ya. 10Ọ bụrụ na o nweghị ụmụnne, unu ga-enye ụmụnne nna ya ihe nketa ya. 11Ọ bụrụ na nna ya enweghị ụmụnne, nye onye ikwu ya kacha dị ya nso nʼikwu ya ihe nketa ya, ka o nweta ya. Nke a ga-abụ ụkpụrụ iwu nye ụmụ Izrel, dịka Nna anyị nyere Mosis nʼiwu.”
Mosis Hụrụ Ala Ahụ
12Mgbe ahụ, Nna anyị gwara Mosis, sị, “Rigoo nʼUgwu Abarim lee ala ahụ m nyere ụmụ Izrel anya. 13Mgbe ị hụchara ya, a ga-achịkọtakwa gị nʼebe ndị gị nọ, dịka e si chịkọta Erọn nwanne gị, 14nʼihi na unu nupụrụ isi megide iwu m nʼọzara Zin, nʼoge ndị nzukọ ahụ sere okwu, mgbe unu jụrụ ịsọpụrụ m dịka onye dị nsọ nʼakụkụ mmiri ahụ nʼihu anya ha—mmiri Meriba nke Kadesh, nʼọzara Zin.”
15Mosis gwara Nna anyị okwu, sị: 16“Ka Nna nke mmụọ niile nke anụ ahụ niile họpụta otu nwoke ga-achị nzukọ ahụ, 17onye ga-apụ nʼihu ha ma baa nʼihu ha, onye ga-edupụta ha ma dubata ha, ka nzukọ Nna anyị ghara ịdị ka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ.”
18Ya mere, Nna anyị gwara Mosis, sị, “Kpọrọ Joshua nwa Nun, nwoke nwere Mmụọ nke Nna anyị nʼime ya, bikwasị aka gị nʼahụ ya. 19Mee ka o guzoro nʼihu Elieza onye nchụàjà na nzukọ ahụ niile, nyefee ya ọrụ nʼihu anya ha. 20Nye ya ụfọdụ nʼikike gị, ka nzukọ ụmụ Izrel niile wee na-erube isi nye ya. 21Ọ ga-eguzo nʼihu Elieza onye nchụàjà, onye ga-ajụtara ya ikpe nke Urim nʼihu Nna anyị. Site nʼokwu Elieza ka ha ga-apụ, sitekwa nʼokwu ya baa—ya na ụmụ Izrel niile ya na ha nọ, bụ nzukọ ahụ niile.”
22Mosis mere dịka Nna anyị nyere nʼiwu: ọ kpọọrọ Joshua mee ka o guzoro nʼihu Elieza onye nchụàjà na nzukọ ahụ niile. 23O bikwasịrị aka ya abụọ nʼahụ ya, nyefee ya ọrụ, dịka Nna anyị si kwuo site nʼọnụ Mosis.