Ihe Nketa Nna anyị Nyere Ifrem
A gara nʼoke ala Ifrem site nʼJeriko rigoro nʼala ugwu ruo nʼosimiri, e nyekwara ha obodo ndị ọzọ nʼime òkè Manase. Ndekọ ahụ ji nkwupụta mechie: a chụpụghị ndị Kenan bi na Geza, kama e mere ha ka ha rụọ ọrụ mmanye.
16 1Oke ala e kenyere ụmụ Josef sitere na Jọdan nke dị na Jeriko, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke mmiri ya, baa nʼọzara nke si na Jeriko rigoro site nʼala ugwu ruo Betel. 2O sitere na Betel ruo Luz, gafee ruo oke ala ndị Akaị nke dị na Atarọt. 3O sitere nʼakụkụ ọdịda anyanwụ rịdaa ruo oke ala ndị Jaflet, ruo oke ala Bet-horon nke Ala, ruo Geza, kwụsị nʼosimiri.
4Ya mere, ụmụ Josef, bụ Manase na Ifrem, nwetara ihe nketa ha. 5Nke a bụ oke ala ụmụ Ifrem dịka ikwu ha si dị: oke ala ha nke ọwụwa anyanwụ sitere na Atarọt-Ada ruo Bet-horon nke Elu. 6Oke ala ahụ gawara ruo osimiri, Mikmetat dị nʼakụkụ ugwu; o chigharịrị gaa nʼọwụwa anyanwụ ruo Taanat-Shaịlo, gafee nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ya ruo Janoa. 7O sitere na Janoa rịdaa ruo Atarọt na Naara, ruo Jeriko, kwụsị na Jọdan. 8Site na Tapua, oke ala ahụ gawara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo Iyi Kena, kwụsị nʼosimiri. Nke a bụ ihe nketa ebo ụmụ Ifrem, dịka ikwu ha si dị. 9Ụmụ Ifrem nwekwara obodo e kewapụtara nʼime ihe nketa ụmụ Manase—obodo niile na obodo nta ha niile. 10Ma ha achụpụghị ndị Kenan bi na Geza; ndị Kenan ka na-ebi nʼetiti ndị Ifrem ruo taa, bụrụ ndị a manyere ịrụ ọrụ.