Bụọrọ Nna Anyị Abụ
Òkù ka a bụọ abụ ma gbuo ikpere n'ala, nke na-atụgharị na mberede ghọọ ịdọ aka na ntị. Ebe ọ bụ Nna anyị mere anyị, anyị bụkwa ìgwè atụrụ ya, olu ya taa dị mkpa: emela ka obi unu sie ike dị ka na Meriba, ebe ọgbọ dum tụfuru izu ike nke na-eche ha.
95 1Bịanụ, ka anyị jiri ọṅụ bụọrọ Nna anyị abụ; ka anyị tie mkpu ike nye Oké Nkume nzọpụta anyị. 2Ka anyị jiri ekele bịakwute ya nʼihu; ka anyị jiri ọṅụ tikuo ya mkpu site nʼabụ otuto. 3Nʼihi na Nna anyị bụ Eze ukwu karịa chi niile. 4Nʼaka ya ka ebe miri emi niile nke ụwa dị, elu ugwu niile bụkwa nke ya. 5Oké osimiri bụ nke ya, nʼihi na ọ bụ ya mere ya, aka ya kpụkwara ala akọrọ.
6Bịanụ, ka anyị fee ofufe ma kpọọ isiala; ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Nna anyị, Onye kere anyị. 7Nʼihi na ọ bụ Nna anyị, anyị onwe anyị bụkwa ndị nke ebe ịta nri ya, igwe atụrụ nọ nʼokpuru aka ya. Taa, ọ bụrụ na unu ga-anụ olu ya, 8unu emekwala ka obi unu sie ike dịka unu mere na Meriba, dịka ọ dị nʼụbọchị ahụ na Masa nʼọzara, a a v8 Meriba na Masa: ebe ndị dị nʼọzara Saịnaị ebe ụmụ Izrel chọsiri mmiri ike ma nwaa Chineke ọnwụnwa (Ọpụpụ 17:1–7).
9ebe nna nna unu ha nwalere m; ha nwara m, ọ bụ ezie na ha ahụla ọrụ m. 10Ruo afọ iri anọ, obi wutere m banyere ọgbọ ahụ, ma m sịrị, “Ha bụ ndị obi ha na-akpafu akpafu, ha amabeghịkwa ụzọ m niile.” 11Ya mere, ejiri m iwe m ṅụọ iyi, “Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.” b b v11 Akwụkwọ ndị Hibru welitere ịdọ aka na ntị a ma gosi na izuike ahụ Nna anyị na-enye ka a na-achọta nʼuju nʼime Jisọs — izuike site na mgbalị, nke a na-abanye site nʼokwukwe, ọ bụghị site nʼobi siri ike.