Ọ Gwụla Na Ọ Wuru Ya
Abụ nrigo. Nke Sọlọmọn.
Ịdọ aka na ntị Sọlọmọn ka a ghara ịdọgbu onwe gị nʼọrụ. Onye na-ewu ụlọ, onye nche, na onye nchegbu na-ebili nʼisi ụtụtụ na-arụ ọrụ nʼefu ma ọ bụrụ na Nna anyị adịghị ya, onye na-enye ndị ọ hụrụ nʼanya ụra. A kpọrọ ụmụaka onyinye e nyere, ọ bụghị ihe e nwetara site nʼọrụ.
127 1Ọ gwụla na Nna anyị wuru ụlọ, ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼefu. Ọ gwụla na Nna anyị na-eche obodo nche, onye nche na-amụ anya nʼefu. 2Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụ ma na-anọ ọdụ ruo nʼabalị, na-eri achịcha nke ọrụ ndọgbu obi nchegbu; nʼihi na ọ na-enye onye ọ hụrụ nʼanya ụra.
3Ụmụ bụ ihe nketa sitere nʼaka Nna anyị, mkpụrụ afọ bụ ụgwọ ọrụ. 4Dịka akụ dị nʼaka dike nʼagha, otu a ka ụmụ a mụrụ nʼoge ntorobịa mmadụ dị. 5Ngọzi na-adịrị nwoke ahụ bụ onye jiri ha mejupụta akpa akụ ya! Ihere agaghị eme ya mgbe ya na ndị iro ya ga-ekwurịta okwu nʼọnụ ụzọ ama. a a v5 Ọnụ ụzọ ama obodo bụ ebe ọha mmadụ na-ezukọ, ebe a na-edozi esemokwu gbasara iwu na okwu obodo — inwe ọtụtụ ụmụ nwoke pụtara inwe ndị siri ike ga-akwado gị nʼebe ahụ.