Ọ dị ugbu a dị ka akwụkwọ e biri ebi

Ilu 4 FHB Father's Heart Bible™

NnaJisọsMmụọ
Mbelata 15% nʼihe mbụ ị zụrụ →
Akwụkwọ

Geenụ Ntị, Ụmụ m

Nna na-enyefe ihe nna ya gwara ya, isiakwụkwọ ahụ na-elekwa ụdọ ahụ anya mgbe niile. Ihe atụ ya gbasara ụzọ: ụzọ na-enwukwu ruo ehihie, megide nke gbara ọchịchịrị nke na ị pụghị ịhụ ihe kpụrụ gị ụkwụ. Chekwaa obi gị, lekwa anya kwụ ọtọ nʼihu.

Isi 4.

Geenụ ntị, ụmụ m, na ndụmọdụ nna; ṅaanụ ntị, nweekwa nghọta. Ana m enye unu ezi ozizi, ya mere unu ahapụla ndụmọdụ m. Nʼihi na mụ onwe m bụụrụ nna m nwa, nwata dị nro, onye naanị ya ka nne m hụrụ nʼanya. O ziri m ihe sị, “Ka obi gị jidesie okwu m ike; debe iwu m, ị ga-adịkwa ndụ. Nweta amamihe, nweta nghọta; echefula, gbakụtakwala okwu ọnụ m azụ. Agbakụtala ya azụ, ọ ga-echebe gị; hụ ya nʼanya, ọ ga-eledo gị anya. Mmalite amamihe bụ nke a: nweta amamihe; werekwa ihe niile i nwetara, nweta nghọta. Nyaa ya ugwu, ọ ga-ebuli gị elu; makụọ ya, ọ ga-ewetara gị nsọpụrụ. Ọ ga-eke gị okpu amara nʼisi; ọ ga-enyekwa gị okpueze ebube.”

Gee ntị, nwa m, naara okwu m, afọ ndụ gị ga-adịkwa ọtụtụ. Ezirela m gị ụzọ amamihe; edurula m gị nʼụzọ ziri ezi. Mgbe ị na-aga ije, nzọụkwụ gị agaghị enwe mgbochi; mgbe ị na-agbakwa ọsọ, ị gaghị asụ ngọngọ. Jidesie ndụmọdụ ike, ahapụla ya; chee ya nche, nʼihi na ọ bụ ndụ gị.

Azọla ụkwụ nʼụzọ ndị ajọ omume, agala ije nʼụzọ ndị na-eme ihe ọjọọ. Zere ya, ejela ije nʼelu ya; si na ya tụgharịa gafee. Nʼihi na ha apụghị ịrahụ ụra ma ọ bụrụ na ha emeghị ihe ọjọọ; a napụla ha izu ike ma ọ bụrụ na ha emeghị ka mmadụ sụọ ngọngọ. Ha na-eri achịcha ajọ omume na-aṅụkwa mmanya ime ihe ike.

Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka ìhè chi ọbụbọ, nke na-enwukwu enwukwu ruo mgbe chi bọziri nke ọma. Ụzọ ndị ajọ omume dị ka oke ọchịchịrị; ha amaghị ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.

Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu m; gee ntị nke ọma nʼokwu ọnụ m. Ekwela ka ha hapụ anya gị; debe ha nʼime ala obi gị. Nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha, bụrụkwa ọgwụgwọ nye ahụ ha niile.

Karịa ihe niile, chee obi gị nche, nʼihi na site na ya ka ihe niile ị na-eme si asọpụta. Wepụ okwu gbagọrọ agbagọ nʼọnụ gị, mekwaa ka egbugbere ọnụ aghụghọ dị anya nʼebe ị nọ. Ka anya gị na-ele anya nʼihu kwụ ọtọ; lekwaa anya gị kpọmkwem nʼihu gị. Tụlee nke ọma ụzọ ụkwụ gị ga-aga, ụzọ gị niile ga-eguzosikwa ike. Atụgharịla gaa aka nri maọbụ aka ekpe; mee ka ụkwụ gị dị anya site nʼihe ọjọọ.