Ogbugbu Ish-Boshet
Ndị isi ndị otu mwakpo abụọ nke Ish-Boshet n'onwe ya mara ya mma nʼakwa ya mgbe ọ na-ezu ike nʼehihie, bulaa isi ya na Hebrọn, na-akpọ ya ọbọ Nna anyị. Devid, onye gburu nwoke kwuru na ya gburu Sọl, mere ka e gbuo ha. E liri isi ahụ nʼili Abna.
4 1Mgbe Ish-Boshet nwa Sọl nụrụ na Abna anwụọla na Hebrọn, obi ike ya daara, ndị Izrel niile makwara jijiji. 2Nwa Sọl nwere ndịisi abụọ nke ndị na-apụnara mmadụ ihe: Baana na Rekab, ụmụ Rimọn onye Beerọt, nke ebo Benjamin—nʼihi na a na-agụkwa Beerọt dịka akụkụ nke Benjamin, 3nʼihi na ndị Beerọt agbaalala Gitaim biekwa nʼebe ahụ dịka ndị ọbịa ruo taa.
4Jonatan, nwa Sọl, nwere otu nwa nwoke ngwụrọ nʼụkwụ abụọ ya. Ọ gbara afọ ise mgbe ozi banyere Sọl na Jonatan si Jezril bịa; onye na-elekọta ya jidere ya ka ọ gbaa ọsọ, ma ka ọ na-eme ngwa ngwa, nwata ahụ si ya nʼaka daa ghọọ onye ngwụrọ. Aha ya bụ Mefiboshet.
5Rekab na Baana, ụmụ Rimọn onye Beerọt, bịara nʼụlọ Ish-Boshet nʼoge okpomọkụ nke ehihie, mgbe ọ na-ezu ike nke ehihie. 6Ha banyere nʼetiti ụlọ ahụ ka a ga-asị na ha na-ewere ọka wiiti, maa ya mma nʼafọ, Rekab na nwanne ya Baana wee gbapụ. 7Ha abanyela nʼụlọ mgbe Ish-Boshet dina nʼelu ihe ndina ya nʼime ọnụụlọ ya. Ha tigburu ya, gbuo ya, bepụ isi ya, were ya, na-eje ije ogologo abalị ahụ niile site nʼụzọ Araba. 8Ha wetaara Devid isi Ish-Boshet na Hebrọn, gwa eze ahụ, sị, “Lee isi Ish-Boshet nwa Sọl, onye iro gị, bụ onye na-achọ ndụ gị. Taa, Nna anyị abọọrọla onyenwe m, bụ eze, ọbọ nʼahụ Sọl na mkpụrụ afọ ya.” a a v8 Ndị ogbu mmadụ ahụ na-ekwu na ọ bụ Nna anyị kpatara mpụ ha mere, ma ọsịsa ya na-abịa site nʼọnụ Devid, onye machibidoro ha dịka ndị gburu onye aka ya dị ọcha.
9Ma Devid zara Rekab na nwanne ya Baana, ụmụ Rimọn onye Beerọt, sị, “Dịka Nna anyị na-adị ndụ, onye gbapụtara ndụ m site na nsogbu ọbụla, 10mgbe otu nwoke gwara m, sị, ‘Lee, Sọl anwụọla,’ na-eche na ọ na-ewetara m ozi ọma, ejidere m ya gbuo ya na Ziklag. Nke ahụ bụ ụgwọ m kwụrụ ya maka ozi ya! 11Olee ka ọ ga-esikwu dị mgbe ndị ajọọ mmadụ gburu onye ezi omume nʼụlọ nke ya, nʼelu ihe ndina nke ya—ọ bụ na m agaghị achọ ọbara ya nʼaka unu ugbu a, wezuga unu site nʼụwa? 12Devid nyere ụmụ okorobịa ya iwu, ha wee gbuo ha, bepụ aka na ụkwụ ha, kwụba ozu ha nʼakụkụ ọdọ mmiri dị na Hebrọn. Ma isi Ish-Boshet ka ha liri nʼili Abna na Hebrọn.”