Chee Obi Gị Nche Megide Ndị Amụma Ụgha
A ga-ajụ ọbụna onye amụma nke ihe ịrịbama ya mezuru ma ọ bụrụ na ọ sị, soro chi ndị ọzọ; Nna gị na-anwale ma ị̀ ji obi gị niile hụ ya n'anya. Otu ihe ahụ metụtara nwanne nwoke a hụrụ n'anya, nwunye ma ọ bụ enyi, nakwa otu obodo dum: nke a bụ ihe egwu kacha njọ nye Izrel.
13 1Ọ bụrụ na onye amụma maọbụ onye na-arọ nrọ ebilie nʼetiti gị, nye gị ihe ịrịbaama maọbụ ọrụ ebube, 2ma ihe ịrịbaama ahụ maọbụ ọrụ ebube ahụ o kwuru banyere ya mezuo, ọ na-asị, ‘Ka anyị soro chi ndị ọzọ ị na-amaghị, ka anyị fekwaa ha,’ 3egela ntị na okwu onye amụma ahụ maọbụ onye na-arọ nrọ ahụ. Nna gị na-anwale gị, iji mata ma ị hụrụ Nna gị nʼanya nʼobi gị niile na mkpụrụobi gị niile. 4Soro Nna gị, tụọ ya egwu, debe iwu ya, rube isi nʼolu ya, fee ya, rapara nʼahụ ya. 5A ga-egbu onye amụma ahụ maọbụ onye na-arọ nrọ ahụ, nʼihi na o kwuru okwu nnupụisi megide Nna gị, onye kpọpụtara gị site nʼIjipt ma gbapụta gị site nʼụlọ ohu, iji mee ka i si nʼụzọ ahụ Nna gị nyere gị nʼiwu ịga wezuga onwe gị. Ya mere wepụ ihe ọjọọ ahụ site nʼetiti gị.
6Ọ bụrụ na nwanne gị nwoke, nwa nne gị, maọbụ nwa gị nwoke maọbụ nwa gị nwanyị, maọbụ nwunye obi gị, maọbụ enyi gị nke dị gị oké ọnụahịa dịka ndụ gị, ejiri nzuzo rafuo gị, na-asị, ‘Ka anyị gaa fee chi ndị ọzọ’—chi ndị gị na ndị nna nna gị na-amaghị, 7chi ndị mmadụ gbara gị gburugburu, ndị dị nso maọbụ ndị dị anya, site nʼotu nsọtụ ụwa ruo nʼnsọtụ nke ọzọ.’ 8Ekwenyela ya maọbụ gee ya ntị; emela ya ebere, ahapụla ya, maọbụ ezola ya. 9Mba—ị ga-egbu ya egbu. Aka gị ga-ebu ụzọ megide ya, mgbe ahụ aka ndị mmadụ niile ga-esokwa. 10Jiri nkume tugbuo ya, nʼihi na ọ gbalịrị ime ka i si nʼebe Nna gị nọ wezuga onwe gị, bụ onye kpọpụtara gị site nʼIjipt, site nʼụlọ ohu. 11Izrel niile ga-anụ ma tụọ egwu, ha agaghịkwa eme ihe ọjọọ dị otú a ọzọ nʼetiti gị.
12Ọ bụrụ na ị nụ ka a na-ekwu banyere otu nʼime obodo gị nke Nna gị na-enye gị ka i biri nʼime ya, 13na ụfọdụ ndị ọjọọ na-abaghị uru esitela nʼetiti gị duhie ndị bi nʼobodo ha, na-asị, ‘Ka anyị gaa fee chi ndị ọzọ unu na-amaghị,’ 14mgbe ahụ chọgharịa, nyochaa, ma jụọ ajụjụ nke ọma. Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu ma kwadoo na e mere ihe arụ a nʼetiti gị, 15ị ga-eji ọnụ mma agha tigbuo ndị bi nʼobodo ahụ, bibie ya kpamkpam—ihe niile dị nʼime ya na anụ ụlọ ya—jiri ọnụ mma agha. 16Chịkọta ihe niile a kwatara nʼagha nʼetiti ama ya, jiri ọkụ kpọọ obodo ahụ na ihe niile a kwatara nʼagha nʼime ya dịka aja nsure ọkụ zuru oke nye Nna gị. Ọ ga-anọgide bụrụ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi, a gaghị ewughachikwa ya ọzọ. 17Ekwela ka ihe ọbụla a raara nye mbibi rapara nʼaka gị, ka Nna gị si nʼoké iwe ya na-ere ọkụ chigharịa, nye gị ọmịiko, mewere gị ebere, ma mee ka ị mụbaa, dịka ọ ṅụụrụ ndị nna nna gị iyi, 18ọ bụrụ na i rube isi nʼolu Nna gị, na-edebe iwu ya niile nke m na-enye gị nʼiwu taa, na-eme ihe ziri ezi nʼanya Nna gị.