Ndị Rekab Na-asọpụrụ Nna Ha
Jeremaya nyere ndị Rekab mmanya, ha jụrụ nʼihi na nna nna ha Jonadab gwara ha ka ha ghara ịṅụ ya. Nrubeisi ha nye nna mmadụ nwụrụ anwụ kemgbe guzo megide ọjụjụ Juda jụrụ ige Nna anyị ntị, onye kwuworo okwu ugboro ugboro. E kwere ezinụlọ Jonadab nkwa ọnọdụ na-adịgide adịgide.
35 1Okwu nke rutere Jeremaya site nʼaka Nna anyị nʼụbọchị Jehoiakim nwa Jozaya, eze Juda, bụ nke a:
2“Gaa nʼụlọ ndị Rekab, gwa ha okwu, kpọbata ha nʼotu ọnụ ụlọ dị nʼakụkụ nke ụlọ m, ma nye ha mmanya ka ha ṅụọ.”
3Ya mere, akpọọrọ m Jaazanaya nwa Jeremaya, nwa Habazinaya, na ụmụnne ya na ụmụ ya ndị ikom niile na ụlọ ndị Rekab niile, 4ma kpọbata ha nʼụlọ Nna anyị, nʼime ọnụ ụlọ nke ụmụ Hanan nwa Igdalaya, onye nke Nna anyị, nke dị nʼakụkụ ọnụ ụlọ ndị ọchịchị, nke dị nʼelu ọnụ ụlọ Maaseya nwa Shalum, onye nche ọnụ ụzọ ama. 5Mgbe ahụ, edobere m efere ndị jupụtara na mmanya na iko nʼihu ụmụ ụlọ ndị Rekab, ma sị, “Ṅụọnụ mmanya.”
6Ma ha sịrị, “Anyị agaghị aṅụ mmanya, nʼihi na nna anyị Jonadab nwa Rekab nyere anyị iwu, sị: Gị na ụmụ gị agaghị aṅụ mmanya ruo mgbe ebighị ebi. 7Unu ewula ụlọ, unu akụla mkpụrụ, unu akụkwala ubi vaịn; unu enwekwala nke ọbụla. Birinụ nʼime ụlọ ikwu ụbọchị niile nke ndụ unu, ka unu wee dị ndụ ọtụtụ ụbọchị nʼala ebe unu bi dị ka ọbịa.’ 8Ya mere, anyị erubeela isi nye Jonadab nwa Rekab, bụ nna anyị, nʼihe niile o nyere anyị nʼiwu: na anyị agaghị aṅụ mmanya ụbọchị niile nke ndụ anyị—anyị, na ndị nwunye anyị, na ụmụ anyị ndị ikom, na ụmụ anyị ndị inyom, 9nakwa na anyị agaghị ewu ụlọ ebe anyị ga-ebi. Anyị enweghị ubi vaịn maọbụ ala ubi maọbụ mkpụrụ, 10kama anyị ebiela nʼime ụlọ ikwu, na-erube isi ma na-eme ihe niile nna anyị Jonadab nyere anyị nʼiwu. 11Ma mgbe Nebukadneza eze Babilọn wakporo ala a, anyị sịrị, ‘Bịanụ, ka anyị gaa Jerusalem iji gbanahụ usuu ndị agha Babilọn na ndị Aram.’ Ya mere, anyị bi na Jerusalem.”
12Mgbe ahụ, okwu Nna anyị rutere Jeremaya, sị:
13Nke a bụ ihe Nna nke usuu ndị agha eluigwe, bụ Nna nke Izrel, na-ekwu: Gwa ndị Juda na ndị bi na Jerusalem, sị: Ọ bụ na unu agaghị anabata ndụmọdụ ma ṅaa ntị nʼokwu m? ka Nna anyị kwupụtara. 14Iwu Jonadab nwa Rekab nyere, bụ ka ụmụ ya ghara iṅụ mmanya, ka a na-edebe; ruo taa ha anaghị aṅụ ya, nʼihi na ha rubere isi nʼiwu nna ha. Ma mụ onwe m agwala unu okwu ugboro ugboro, ma unu egeghị m ntị.
15Ugboro ugboro, ezigaara m unu ndị ohu m niile bụ ndị amụma, na-asị, ‘Ka onye ọbụla nʼime unu si nʼụzọ ọjọọ ya chegharịa ma mezie omume ya. Unu agbasola chi ndị ọzọ ka unu fee ha, unu ga-ebikwa nʼala ahụ m nyere unu na nna nna unu.’ Ma unu egeghị ntị maọbụ ṅaa m ntị. 16Ụmụ ụmụ Jonadab nwa Rekab debere iwu nna ha, ma ndị a egeghị m ntị.
17Ya mere, Nna nke usuu ndị agha eluigwe, bụ Nna nke Izrel, na-ekwu, sị: “Ana m ewetara Juda na ndị niile bi na Jerusalem mbibi ọbụla m kwupụtara megide ha, nʼihi na m gwara ha okwu ma ha egeghị ntị, akpọrọ m ha ma ha azaghị.”
18Jeremaya gwara ụlọ ndị Rekab, sị, “Nke a bụ ihe Nna nke usuu ndị agha eluigwe, bụ Nna nke Izrel, na-ekwu: Nʼihi na unu rubere isi nʼiwu nna unu Jonadab, debe ntụziaka ya niile, ma mee ihe niile o nyere unu nʼiwu, 19ya mere Nna nke usuu ndị agha eluigwe, bụ Nna nke Izrel, na-ekwu, sị: Jonadab nwa Rekab agaghị akọ onye ga-eguzo nʼihu m mgbe niile.”