Olileanya Ka Dịịrị Ndị Nna Anyị
Shekanaya kwuputara ìhè na olileanya ka dị. Nzukọ ahụ zukọrọ n'oké mmiri ozuzo nke oge oyi wee gbaa ndụ na Nna anyị na a ga-agbasa alụmdi na nwunye ha na ndị mba ọzọ. Ezra họpụtara ndị nwoke ga-enyocha okwu ọ bụla n'obodo n'obodo. A kpọkwara aha ndị mebiri okwukwe.
10 1Mgbe Ezra nọ na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie, na-ebe akwa, na-adaba nʼala nʼihu ụlọ Nna anyị, oke ọgbakọ ndị Izrel—ndị ikom, ndị inyom, ụmụaka—zukọrọ bịakwute ya, ndị mmadụ ahụ bekwara akwa nke ukwuu. 2Mgbe ahụ, Shekanaya nwa Jehaiel, otu nʼime ụmụ Ịlam, gwara Ezra sị, “Anyị ekwesịghị ntụkwasị obi nye Nna anyị site nʼịlụ ndị inyom ala ọzọ sitere nʼetiti ndị ala a. Ma olileanya ka dịịrị Izrel nʼagbanyeghị nke a. 3Ya mere ugbu a, ka anyị na Nna anyị gbaa ndụ ịchụpụ ndị nwunye a niile na ụmụ ha, dịka onyenwe m na ndị na-ama jijiji nʼihu iwu Nna anyị si dụọ ọdụ; ka e mee ya dịka Iwu ahụ si dị. 4Bilie, nʼihi na okwu a dabeere nʼaka gị, anyị nọnyekwara gị. Dị ike ma mee ihe.”
5Ezra wee bilie mee ka ndịisi nchụaja, ndị Livaị, na Izrel niile ṅụọ iyi ime dịka e kwekọrịtara. Ha wee ṅụọ iyi ahụ.
6Mgbe ahụ, Ezra siri nʼihu ụlọ Nna anyị bilie gaa nʼọnụụlọ Jehohanan nwa Elaiashib, nọọ nʼabalị ahụ na-erighị nri maọbụ ṅụọ mmiri, nʼihi na ọ nọ na-eru uju nʼihi ekwesịghị ntụkwasị obi nke ndị a dọọrọ nʼagha. 7Ha wee zipụ okwu na Juda na Jerusalem niile ka ndị niile lọtara site na ndọta nʼagha zukọta na Jerusalem. 8Onye ọbụla na-abịaghị nʼime ụbọchị atọ, dịka mkpebi nke ndịisi ọrụ na ndị okenye si dị, ga-atụfu ihe niile o nwere, a ga-achụpụkwa ya nʼọgbakọ nke ndị lọtara site na ndọta nʼagha.
9Ndị ikom niile nke Juda na Benjamin zukọrọ na Jerusalem nʼime ụbọchị atọ—nʼụbọchị nke iri abụọ nke ọnwa nke itoolu. Ndị mmadụ niile nọdụrụ ala nʼama dị nʼihu ụlọ Nna anyị, na-ama jijiji nʼihi okwu a nakwa nnukwu mmiri ozuzo.
10Ezra onye nchụaja biliri sị ha, “Unu ekwesịghị ntụkwasị obi, na-alụ ndị inyom ala ọzọ, na-atụkwasị nʼikpe ọmụma nke Izrel. 11Ugbu a, kwupụtaranụ Nna anyị, bụ Chineke nna unu ha, meekwa uche ya. Kewaanụ onwe unu site nʼetiti ndị ala a nakwa site nʼebe ndị inyom ala ọzọ nọ.”
12Mgbe ahụ, ọgbakọ ahụ niile jiri oke olu zaa, sị, “Ee! Anyị aghaghị ime dịka ị kwuru. 13Ma ndị mmadụ dị ọtụtụ, ọ bụkwa oge mmiri ozuzo, ya mere anyị enweghị ike iguzo nʼezi. Nke a abụghị ọrụ nke otu ụbọchị maọbụ ụbọchị abụọ, nʼihi na anyị emehiela nke ukwuu nʼokwu a. 14Ka ndịisi anyị rụọ ọrụ nʼọnọdụ ọgbakọ ahụ niile. Ka ndị niile nọ nʼobodo anyị bụ ndị lụrụ ndị inyom ala ọzọ bịa nʼoge a kara aka, ya na ndị okenye na ndị ikpe nke obodo ọbụla, ruo mgbe oke iwe Nna anyị nʼihi okwu a ga-esi nʼebe anyị nọ pụọ.”
15Naanị Jonatan nwa Asahel na Jazaya nwa Tikva megidere nke a; Meshulam na Shabetaị onye Livaị kwadoro ha.
16Ya mere ndị lọtara site na ndọta nʼagha mere nke a. Ezra onye nchụaja họpụtara ndị ikom, ndịisi nke ezinụlọ nna ha, a kpọrọ onye ọbụla aha, maka ụlọ nna ha. Nʼụbọchị mbụ nke ọnwa nke iri, ha nọdụrụ ala inyocha okwu ahụ, 17ruo nʼụbọchị nke mbụ nke ọnwa mbụ, ha wee rụchaa okwu banyere ndị ikom niile lụrụ ndị inyom ala ọzọ.
Ndị Na-ekwesịghị Ntụkwasị Obi
18Nʼetiti ụmụ ndị nchụaja bụ ndị a chọpụtara na ha lụrụ ndị inyom ala ọzọ: ụmụ Jeshua nwa Jozadak na ụmụnne ya—Maaseaya, Elieza, Jarib, na Gedalaya.
19Ha kwere nkwa ịchụpụ ndị nwunye ha; ebe ha bụ ndị ikpe mara, ha chụrụ ebule sitere nʼìgwè anụ dịka àjà maka ikpe ọmụma ha.
20Nʼime ụmụ Ima: Hananaị na Zebadaya.
21Nʼime ụmụ Harim: Maaseaya, Ịlaịja, Shemaya, Jehaiel, na Ụzaya.
22Nʼime ụmụ Pashua: Elioenaị, Maaseaya, Ishmel, Netanel, Jozabad, na Elasa.
23Nʼime ndị Livaị: Jozabad, Shimeaị, Kelaya (ya bụ, Kelita), Petahaya, Juda, na Elieza.
24Nʼime ndị ọbụ abụ: Elaiashib. Nʼime ndị nche ọnụ ụzọ ama: Shalum, Telem, na Uraị.
25Nʼime Izrel: nʼime ụmụ Parosh—Ramaya, Izaya, Malkaịja, Mijamin, Eleaza, Malkaịja, na Benaya.
26Nʼime ụmụ Ịlam: Matanaya, Zekaraya, Jehaiel, Abdaị, Jeremot, na Ịlaịja.
27Nʼime ụmụ Zatu: Elioenaị, Elaiashib, Matanaya, Jeremot, Zabad, na Aziza.
28Nʼime ụmụ Bebaị: Jehohanan, Hananaya, Zabaị, na Atlaị.
29Nʼime ụmụ Banaị: Meshulam, Maluk, Adaya, Jashub, Shil, na Jeremot.
30Nʼime ụmụ Pahat-moab: Adna, Kelal, Benaya, Maaseaya, Matanaya, Bezalel, Binuị, na Manase.
31Nʼime ụmụ Harim: Elieza, Ishaịja, Malkaịja, Shemaya, Shimeon, 32Benjamin, Maluk, na Shemaraya.
33Nʼime ụmụ Hashum: Matenaị, Mattata, Zabad, Elifelet, Jeremaị, Manase, na Shimeaị.
34Nʼime ụmụ Banaị: Maadaị, Amram, Uel, 35Benaya, Bedaya, Keluhi, 36Vanaya, Meremot, Elaiashib, 37Matanaya, Matenaị, na Jaasu. 38Nʼime ụmụ Binuị: Shimeaị, 39Shelemaya, Netan, Adaya, 40Maknadebaị, Shashaị, Sharaị, 41Azarel, Shelemaya, Shemaraya, 42Shalum, Amaraya, na Josef.
43Nʼime ụmụ Nibo: Jeiel, Matitaya, Zabad, Zebina, Jadaị, Joel, na Benaya.
44Ndị a niile lụrụ ndị inyom ala ọzọ, ụfọdụ nʼime ha nwekwara ndị nwunye ha mụtaara ụmụ.