Ịdị Ukwu nke Mọdekaị
Ihe ndetu njedebe nwere amaokwu atọ nʼụdị akwụkwọ ndekọ eze: eze tụrụ ụtụ nʼala na nʼakụkụ osimiri, a na-echetakwa Mọdekaị, onye bụzi onye nke abụọ naanị nʼocheeze, maka iji ike ahụ chọọ ọdịmma ndị ya na ikwuru ndị nke ya udo.
Isi 10.
10 1Eze Zerksis manyere ala ahụ na ala ndị dị nʼụsọ oke osimiri ụtụ. 2Ọ bụ na e deghị ọrụ ike na ịdị ike ya niile, na akụkọ zuru ezu banyere ịdị ukwu nke eze ahụ buliri Mọdekaị elu, nʼime Akwụkwọ Akụkọ Ihe Mere Eme nke ndị eze Midia na Peshia? 3Mọdekaị onye Juu bụ onye nke abụọ nʼokpuru Eze Zerksis, onye dị ukwu nʼetiti ndị Juu, onye ọtụtụ ụmụnne ya nwere ihuọma nʼebe ọ nọ, na-achọ ọdịmma ndị nke ya, na-ekwu okwu udo nye ụmụ ụmụ ya niile.