Ọ bụrụ naanị na unu ga-ege ntị
Nye onyeisi ndị ọbụ abụ; nʼelu gittith. Abụ Ọma Asaf.
Egwu mmemme — opi, ịgba, ọnwa ọhụrụ — nke olu Nna anyị nʼonwe ya bịara kwụsịa. O chetara otú o si bupụ nkata nʼubu ha, ma sị: saghee ọnụ gị, m ga-emejukwa ya. Mgbe ahụ, ihe mgbu ahụ: a sị na ndị m ga-ege ntị!
81 1Werenụ ọṅụ bụkuru Nna anyị, bụ ike anyị; tikuoronụ Chineke nke Jekọb mkpu ọṅụ! 2Malitenụ abụ, kụọnụ ịgbà egwu, une na-atọ ụtọ na ụbọ akwara. 3Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ, nʼoge ọnwa dị mbara, nʼụbọchị mmemme anyị. 4Nʼihi na ọ bụ iwu nye Izrel, bụ ụkpụrụ Chineke nke Jekọb.
5O guzobere ya ka ọ bụrụ ihe ama nye Josef mgbe o pụrụ imegide ala Ijipt. Anụrụ m asụsụ nke m na-amaghị:
6“Ewepụrụ m ibu arọ site nʼubu ya; a napụtara aka ya site na nkata.
7“Nʼime nsogbu unu, unu kpọrọ oku, azọpụtara m unu; azara m unu site nʼebe nzuzo nke égbè eluigwe; anwalere m unu nʼakụkụ mmiri Meriba. 8Geenụ ntị, ndị m, m ga-adọ unu aka na ntị— unu Izrel, a sị na naanị unu ga-ege m ntị! 9Chi mba ọzọ ọbụla agaghị adị nʼetiti unu; unu agaghị akpọ isiala nye chi ọzọ ọbụla.
10“Abụ m Nna unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt. Saghee ọnụ unu nke ukwuu, m ga-emejupụta ya. 11Ma ndị m jụrụ ige olu m ntị; Izrel ekweghị irubere m isi. 12Ya mere, ahapụrụ m ha nye obi isiike ha, ka ha gbasoo atụmatụ nke aka ha. 13A sị na naanị ndị m ga-ege m ntị, a sị na Izrel ga-eje ije nʼụzọ m niile! 14Lee ka ọ ga-adị m ngwa ime ka ndị iro ha daa, tụgharịakwa aka m megide ndị na-akpọ ha asị! 15Ndị kpọrọ Nna anyị asị ga-ada nʼihu ya nʼụjọ, ịla nʼiyi ha ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 16Ma ọ ga-eji ọka kachasị mma zụọ ha; ọ bụ mmanụ aṅụ si nʼoké nkume ka m ga-eji mee ka afọ ju unu.”