Gọzie Anyị ma Mụkwasị Anyị Ìhè
Nye onyeisi abụ. Eji ụbọ eriri akpọ ya. Abụ Ọma. Otu abụ.
Ngọzi owuwe ihe ubi dị mkpụmkpụ, nke e chere ihu nʼezí. Ndị mmadụ na-arịọ Nna anyị amara na ihu na-enwu gbaa nʼelu ha, ka e wee mara ụzọ ya nʼebe niile, ha na-ekwughachikwa otu arịrịọ ugboro abụọ: ka ndị niile — ha niile — too ya ma ṅụrịa ọṅụ.
67 1Ka Nna anyị meere anyị ebere ma gọzie anyị, meekwa ka ihu ya mụkwasị anyị ìhè, a a v1 Sela: akara na-egosi nkwụsịtụ nʼegwu maọbụ nʼofufe; ihe ọ pụtara kpọmkwem edoghị anya. 2ka amata ụzọ gị nʼụwa, ka amatakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile. 3Ka ndị mmadụ too gị, Nna anyị; ka ndị mmadụ niile too gị. 4Ka mba niile ṅụrịa ọṅụ ma bụọ abụ nʼihi obi ụtọ, nʼihi na ị na-ekpe ndị mmadụ ikpe ziri ezi ma na-edu mba niile nọ nʼụwa.
5Ka ndị mmadụ too gị, Nna anyị; ka ndị mmadụ niile too gị. 6Ụwa amịpụtala ihe ubi ya; Nna anyị, ọbụladị Nna anyị nke anyị, na-agọzi anyị. 7Ka Nna anyị gọzie anyị, ka nsọtụ niile nke ụwa tụọkwa ya egwu.