Kpee M Ikpe, Nna
Nke Devid.
Devid na-arịọ ka e nyochaa ya, ka a nwalee ma nụchaa obi ya na uche ya, n'ihi na ọ zerela ndị aghụghọ na aka juputara n'iri ngarị. Ihe ọ chọrọ abụghị mkpebi ikpe kama ọ bụ ebe: ụlọ ebe ebube Nna ya na-adịgide.
26 1Kpee m ikpe, Nna m, nʼihi na ejeela m ije nʼizuoke m, otụkwasịkwala m obi na Nna m na-enweghị ịla azụ.
2Nyochaa m, Nna m, nwaakwa m; nụchaa obi m na uche m. 3Nʼihi na ịhụnanya ọgbụgba ndụ gị dị nʼihu anya m, ana m ebikwa ndụ site nʼikwesi ntụkwasị obi gị.
4Mụ na ndị aghụghọ anaghị anọkọ, mụ na ndị ihu abụọ anaghịkwa emekọ ihe. 5Akpọrọ m nzukọ ndị na-eme ihe ọjọọ asị, mụ na ndị ajọ omume agaghịkwa anọkọ ọnụ. 6Ana m asa aka m nʼizi ezi, ana m agbakwa ebe ịchụ aja gị gburugburu, Nna m, 7na-eji olu dara ụda ekwuputa ekele m, na-akọkwa banyere ọrụ ebube gị niile.
8Nna m, ahụrụ m ụlọ ebe i bi nʼanya, ebe ahụ ebube gị na-ezu ike.
9Ekpochapụkwala mkpụrụ obi m na ndị mmehie, maọbụ ndụ m na ndị na-eme ihe ike, 10bụ ndị atụmatụ ọjọọ dị nʼaka ha, ndị aka nri ha jupụtara nʼihe iri ngarị. 11Ma mụ onwe m, ana m ebi ndụ nʼizuoke; gbapụta m, meekwa m ebere.
12Eguzo m nʼala dị larịị; nʼoke nzukọ ahụ ka m ga-agọzi Nna m.