Nna Doro Agbụrụ Ndị Nchụaja Livaị Iche
A na-eso usoro Livaị site na Erọn ruo onye nchụaja ahụ gara biri nʼala ọzọ, mgbe ahụ site na ndị ọbụ abụ Devid họpụtara maka ụlọ Nna anyị. E nyere ebo ahụ na-enweghị ihe nketa ala obodo iri anọ na asatọ gbasara nʼime ókèala ndị ọzọ niile.
6 1Ụmụ ndị ikom Livaị bụ: Geshọn, Kohat, na Merarai. 2Ụmụ ndị ikom Kohat bụ: Amram, Izha, Hebrọn, na Uziel. 3Ụmụ Amram bụ: Erọn, Mosis, na Miriam. Ụmụ ndị ikom Erọn bụ: Nadab, Abaịhu, Eliaza, na Itama. 4Eliaza mụrụ Finehas, Finehas mụrụ Abishua, 5Abishua mụrụ Bukaị, Bukaị mụrụ Uzaị, 6Uzaị mụrụ Zerahaya, Zerahaya mụrụ Meraiot, 7Meraiot mụrụ Amaraya, Amaraya mụrụ Ahaitub, 8Ahaitub mụrụ Zadọk, Zadọk mụrụ Ahimaaz, 9Ahimaaz mụrụ Azaraya, Azaraya mụrụ Johanan, 10Johanan mụrụ Azaraya, onye jere ozi dịka onye nchụaja nʼụlọnsọ ukwu ahụ Sọlọmọn wuru na Jerusalem. 11Azaraya mụrụ Amaraya, Amaraya mụrụ Ahaitub, 12Ahaitub mụrụ Zadọk, Zadọk mụrụ Shalum, 13Shalum mụrụ Hilkaya, Hilkaya mụrụ Azaraya, 14Azaraya mụrụ Serahaya, Serahaya mụrụ Jehozadak. 15Jehozadak gara biri nʼala ọzọ mgbe Nna anyị sitere nʼaka Nebukadneza chụpụ Juda na Jerusalem.
16Ụmụ ndị ikom Livaị bụ: Geshọm, Kohat, na Merarai. 17Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Geshọm: Libnaị na Shimei. 18Ụmụ ndị ikom Kohat bụ: Amram, Izha, Hebrọn, na Uziel. 19Ụmụ ndị ikom Merarai bụ: Mahlaị na Mushaị. Ndị a bụ agbụrụ ndị Livaị dịka ụlọ nna nna ha si dị. 20Site na Geshọm: Libnaị nwa ya, Jahat nwa ya, Zima nwa ya, 21Joa nwa ya, Ido nwa ya, Zera nwa ya, Jeaterai nwa ya. 22Ụmụ ụmụ Kohat bụ: Aminadab nwa ya, Kora nwa ya, Asịa nwa ya, 23Elkena nwa ya, Ebiasaf nwa ya, Asịa nwa ya, 24Tahat nwa ya, Uriel nwa ya, Uzaya nwa ya, na Shaul nwa ya. 25Ụmụ ndị ikom Elkena bụ: Amasaị na Ahimot, 26Elkena nwa ya, Zofaị nwa ya, Nahat nwa ya, 27Eliab nwa ya, Jeroham nwa ya, Elkena nwa ya. 28Ụmụ ndị ikom Samuel bụ: Joel ọkpara ya na Abaịja nke abụọ. 29Ụmụ ndị ikom Merarai bụ: Mahlaị, Libnaị nwa ya, Shimei nwa ya, Uza nwa ya, 30Shimea nwa ya, Hagaya nwa ya, na Asaya nwa ya.
31Ndị a bụ ndị ikom Devid họpụtara ịhụ maka egwu nʼụlọ Nna anyị mgbe igbe ọgbụgba ndụ ahụ bịara zuru ike. 32Ha jiri abụ jee ozi nʼihu ụlọ nzute ahụ, bụ ụlọikwuu nzukọ ahụ, ruo mgbe Sọlọmọn wuru ụlọ Nna anyị na Jerusalem, ha jekwara ozi ha dịka usoro e doziri ha si dị. 33Ndị a bụ ndị jere ozi, ha na ụmụ ha. Site nʼagbụrụ Kohat: Heman onye ọbụ abụ, nwa Joel, nwa Samuel, 34nwa Elkena, nwa Jeroham, nwa Eliel, nwa Toa, 35nwa Zuf, nwa Elkena, nwa Mahat, nwa Amasaị, 36nwa Elkena, nwa Joel, nwa Azaraya, nwa Zefanaya, 37nwa Tahat, nwa Asịa, nwa Ebiasaf, nwa Kora, 38nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livaị, nwa Izrel. 39Nwanne ya nwoke Asaf guzoro nʼaka nri Heman: Asaf nwa Berekaya, nwa Shimea, 40nwa Maịkel, nwa Baaseya, nwa Malkaịja, 41nwa Etnaị, nwa Zera, nwa Adaya, 42nwa Etan, nwa Zima, nwa Shimei, 43nwa Jahat, nwa Geshọm, nwa Livaị. 44Nʼaka ekpe, ụmụnne ha, bụ ụmụ ndị ikom Merarai: Etan nwa Kishaị, nwa Abdaị, nwa Maluk, 45nwa Hashabaya, nwa Amazaya, nwa Hilkaya, 46nwa Amzaị, nwa Banaị, nwa Shema, 47nwa Mahlaị, nwa Mushaị, nwa Merarai, nwa Livaị.
48A họpụtara ụmụnna ha ndị Livaị ka ha rụọ ọrụ niile nke ụlọ nzute ahụ, bụ ụlọ Nna anyị. 49Ma Erọn na ụmụ ya ndị ikom na-achụ aja nʼelu ebe ịchụ aja nsure ọkụ na nʼelu ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, na-arụ ọrụ niile nke Ebe Kachasị Nsọ ahụ, na-ekpuchikwara Izrel mmehie, dịka ihe niile Mosis, bụ ohu Nna anyị, nyere nʼiwu si dị.
50Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Erọn: Eliaza nwa ya, Finehas nwa ya, Abishua nwa ya, 51Bukaị nwa ya, Uzaị nwa ya, Zerahaya nwa ya, 52Meraiot nwa ya, Amaraya nwa ya, Ahaitub nwa ya, 53Zadọk nwa ya, na Ahimaaz nwa ya.
54Ndị a bụ ebe obibi ha na obodo ha nʼime oke ala ha: ụmụ ụmụ Erọn ndị si nʼagbụrụ Kohat nwetara nza mbụ, 55e nyekwara ha Hebrọn nʼala Juda, ya na ala ịta nri anụ ụlọ gbara ya gburugburu. 56Ma ha nyere Kaleb nwa Jefune ala ubi obodo ahụ na obodo nta ya niile. 57Ya mere, e nyere ụmụ ụmụ Erọn obodo mgbaba ndị a: Hebrọn, Libna ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, Jatịa, Eshtemoa ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, 58Hilen ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, Debịa ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, 59Ashan ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, na Bet-shemesh ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya. 60Site nʼebo Benjamin: Geba, Alemet, na Anatọt, nke ọ bụla ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya—obodo iri na atọ nʼọnụ ọgụgụ, dịka agbụrụ ha si dị.
61E kenyere ndị Kohat fọdụrụ obodo iri site nʼagbụrụ nke ọkara ebo Manase. 62E nyere ndị Geshọm, dịka agbụrụ ha si dị, obodo iri na atọ site nʼebo Isaka, Asha, Naftalaị, na akụkụ Manase nke dị na Bashan. 63E kenyere ndị Merarai, agbụrụ nʼagbụrụ, obodo iri na abụọ site nʼebo Ruben, Gad, na Zebụlọn. 64Ya mere, ụmụ Izrel nyere ndị Livaị obodo ndị a, ha na ala ịta nri anụ ụlọ ha. 65Site nʼebo Juda, Simiọn, na Benjamin ka ha si kenye obodo ndị ahụ a kpọrọ aha ha nʼelu.
66E nyere ụfọdụ agbụrụ ndị Kohat obodo site nʼebo Ifrem ka ọ bụrụ oke ala ha. 67E nyere ha obodo mgbaba ndị a: Shekem ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya nʼelu ugwu Ifrem, na Geza ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, 68Jokmeam ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, Bet-horon ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, 69Aịjalọn ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, na Gat-rimọn ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya. 70Site nʼọkara ebo Manase: Ana ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya na Bileam ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, maka agbụrụ ndị Kohat fọdụrụ.
71Ndị Geshọm nwetara site nʼagbụrụ nke ọkara ebo Manase: Golan nke dị na Bashan ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, na Ashtarọt ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, 72site nʼebo Isaka, Kedesh ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, Daberat ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, 73Ramọt ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, na Anem ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya; 74site nʼebo Asha, Mashal ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, Abdọn ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, 75Hukọk ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, na Rehob ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya; 76site nʼebo Naftalaị: Kedesh nke dị na Galili ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, Hamọn ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, Kiriataịm ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya.
77Ndị Merarai fọdụrụ nwetara, site nʼebo Zebụlọn, Rimọno ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya na Tabọ ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, 78nʼofe osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jeriko, site nʼebo Ruben: Beza nke dị nʼọzara ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, Jaza ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, 79Kedemot ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, na Mefaat ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya; 80na site nʼebo Gad, Ramọt nke dị na Gilead ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, Mahanaim ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, 81Heshbọn ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya, na Jeza ya na ala ịta nri anụ ụlọ ya.