Ndị Isi Ikwu Kwuru Okwu
Ndị isi ikwu Manase gosiri na ọ bụrụ na ụmụ nwanyị Zelofehad alụọ di nʼebo ọzọ, ha ga-eburu ala ha soro ha pụọ. Ikpe e kpere: ha nwere ike ịlụ onye ọbụla ha chere kacha mma, kama nʼime ikwu nna ha, ka ihe nketa ebo ọbụla ghara iji nwayọọ wụpụ banye nʼebo ọzọ.
36 1Ndị isi ezinaụlọ nke ikwu Gịlead—ụmụ Makia nwa Manase, ndị si nʼikwu Josef—bịaruru ma kwuo okwu nʼihu Mosis na ndị ndu, bụ ndị isi ezinaụlọ nke ụmụ Izrel. 2Ha sịrị, “Nna anyị nyere onyenwe m iwu ka o site nʼife nza kesaa ala ahụ dịka ihe nketa nye ụmụ Izrel, Nna anyị nyekwara onyenwe m iwu ka o nye ụmụ nwanyị nwanne anyị Zelofehad ihe nketa ya. 3Ọ bụrụ na ha lụọ ndị ikom si nʼebo ụmụ Izrel ndị ọzọ, a ga-ewepụ ihe nketa ha nʼihe nketa nna anyị ha ma tụkwasị ya nʼnke ebo ọhụrụ ha, nke ga-eme ka ihe nketa e kenyere anyị dịkwaa nta. 4Mgbe afọ jubili nke Izrel ga-eru, ihe nketa ha ga-abanye nʼihe nketa ebo ha lụbanyere na ya, nke a ga-anapụ site nʼihe nketa ebo nna anyị ha.”
5Ya mere Mosis nyere ụmụ Izrel iwu dịka okwu Nna anyị si dị, sị, “Ebo Josef kwuru okwu ziri ezi.
6Nke a bụ ihe Nna anyị nyere nʼiwu banyere ụmụ nwanyị Zelofehad: ha nwere ike ịlụ onye ọbụla ha chere kacha mma, naanị nʼime ikwu ebo nna ha.
7Ọ dịghị ihe nketa onye Izrel ọbụla ga-esi nʼotu ebo gafee na ebo ọzọ; onye Izrel ọbụla ga-ejigide ihe nketa ebo nna nna ya. 8Nwa nwanyị ọbụla ketara ihe nketa nʼime ebo Izrel ọbụla ga-alụ di nʼime ikwu ebo nna ya, ka onye Izrel ọbụla wee jigide ihe nketa nna nna ya. 9Ọ dịghị ihe nketa ga-esi nʼotu ebo gafee na ebo ọzọ; ebo ọbụla nke Izrel ga-ejigidesi ihe nketa nke ya aka ike.”
10Dịka Nna anyị si nye Mosis iwu, otu a ka ụmụ nwanyị Zelofehad mere. 11Mahla, Tịza, Hogla, Mịlka, na Noa, bụ ụmụ nwanyị Zelofehad, lụrụ ụmụ nwanne nna ha. 12Ha lụbanyere nʼime ikwu ụmụ Manase nwa Josef, ihe nketa ha nọgidekwara nʼime ikwu ebo nna ha.
13Ndị a bụ iwu na mkpebi Nna anyị nyere site nʼaka Mosis nye ụmụ Izrel nʼala dị larịị nke Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan na Jeriko.