Wepụ Ihere Anyị
Ụmụ nwanyị asaa ga-arịọ otu nwoke aha ya naanị ka ihere ha pụọ. Ma a ga-akpọ ndị fọdụrụ nʼJerusalem ndị nsọ, a ga-asachapụ ntụpọ ọbara ha, Nna anyị na-agbasakwa nʼelu Zayọn igwe ojii na ọkụ — ezi ebe mgbaba site nʼokpomọkụ na oké mmiri ozuzo.
4 1Nʼụbọchị ahụ, ụmụ nwanyị asaa ga-ejide otu nwoke, na-asị, “Anyị ga-eri nri nke anyị, yikwa uwe nke anyị; naanị ka e were aha gị kpọọ anyị. Wepụ ihere anyị.”
Alaka ahụ, Nke Mara Mma ma Dị Ebube
2Nʼụbọchị ahụ, Alaka nke Nna anyị ga-ama mma ma dịkwa ebube, mkpụrụ ala ahụ ga-abụkwa mpako na ebube nke ndị fọdụrụ nʼIzrel. a a v2 Alaka bụ aha Nna anyị ji akpọ Jisọs, nwa agbụrụ Devid ahụ e kwere na nkwa — otu aha ahụ e nyekwara ya nʼoge mesịrị nʼakwụkwọ Jeremaya na Zekaraya. 3Onye ọbụla fọdụrụ na Zayọn ma nọgide na Jerusalem ka a ga-akpọ onye nsọ—onye ọbụla e dekọrọ aha ya maka ndụ na Jerusalem, 4mgbe Nna anyị, Onye kachasị elu, sachapụchaala unyi nke ụmụ ada Zayọn ma sachapụ ntụpọ ọbara nke Jerusalem site nʼime ya, site na mmụọ ikpe na mmụọ ọkụ na-ere ere. 5Mgbe ahụ, Nna anyị ga-eke nʼelu ebe niile nke Ugwu Zayọn na nʼelu ọgbakọ ya niile igwe ojii nʼehihie na anwụrụ ọkụ, na ọkụ na-enwu enwu na-amụ amụ nʼabalị; nʼihi na a ga-enwe ihe mkpuchi nʼelu ebube ahụ niile. 6Ọ ga-abụ ụlọ nchekwa iji nye ndo site nʼokpomọkụ nʼehihie, bụrụkwa ebe mgbaba na ebe nzuzo site nʼoke ifufe na mmiri ozuzo.